Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ka gị na Chineke bụrụ enyi?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU . . .

na ha agaghị abụli enyi Chineke n’ihi na ha bụ ndị mmehie. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe banyere anyị anaghị emetụ Chineke n’obi. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke “na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Ilu 3:32) Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi, anyị na ya ga-abụ enyi.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Chineke chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi.—Jems 4:8.

  • Chineke bụ enyi anyị. Ọ dị njikere ịgbaghara anyị ma nyere anyị aka.—Abụ Ọma 86:5.

  • Ndị enyi Chineke na-eme ihe dị Chineke mma, ha na-akpọkwa ihe Chineke kpọrọ asị, asị.—Ndị Rom 12:9.