Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

Ọtụtụ ndị sị na ha kweere na Chineke. Ma, ị jụọ ha onye Chineke bụ, ha ana-ekwu ihe dị iche iche. Ụfọdụ na-ekwu na Chineke bụ onyeikpe obi kpọrọ nkụ, na naanị ihe dị ya mkpa bụ ịta ndị mmadụ ahụhụ ma ha mee ihe ọjọọ. Ndị ọzọ ana-ekwu na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-agbagharakwa ha n’agbanyeghị ihe ha mere. Ndị ọzọ kwekwaara na ọ nọ anyị n’ebe dị anya nakwa na ọ chọghị ịma banyere anyị. Ihe ndị a dị iche iche ndị mmadụ na-ekwu nwere ike ime ka ọtụtụ ndị chee na ọ gaghị ekwe omume mmadụ ịmara onye Chineke bụ.

Ọ̀ dị mkpa ịma onye Chineke bụ? Ee, ọ dị mkpa. Ịmata Chineke nke ọma nwere ike ime ka ndụ gị nwee isi. (Ọrụ Ndịozi 17:26-28) Ka ị na-abịarụkwu Chineke nso ka ọ ga na-ahụkwu gị n’anya, na-enyekwara gị aka. (Jems 4:8) Ihe kacha mkpa bụ na ịmata Chineke nke ọma ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

Olee otú ị ga-esi mata onye Chineke bụ? Chegodị gbasara ezigbo enyi gị ị ma nke ọma. Olee otú gị na ya si malite dịwa ná mma? O nwere ike ịbụ na i bu ụzọ mata aha ya, ụdị onye ọ bụ, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, ihe ndị o merela na ihe ndị ọ chọrọ ime nakwa ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ihe ndị ahụ ị matara gbasara onye ahụ mere ka gị na ya dịrị ná mma.

Anyị nwekwara ike ịmata onye Chineke bụ ma ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ndị a na-esonụ:

Ụlọ Nche a ga-eji Baịbụl zaa ajụjụ ndị a. Isiokwu ndị dị na ya ga-enyere gị aka ịmata onye Chineke bụ na uru ị ga-erite ma gị na ya dịrị ná mma.