Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Igurube nke Nwere Oge Ha Ji Apụta

Igurube nke Nwere Oge Ha Ji Apụta

IGURUBE dị ná mpaghara ụwa niile ma e wezụga n’Antaktika. Ma, o nwere ụdị nke dị n’ebe ugwu Amerịka. Ọ bụ ụdị nke a e sere ebe a. E nwere oge a kapịrị ọnụ ha na-eji apụta. Ndụ igurube a ka na-agbagwoju ndị ọkachamara anya.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Nde kwuru nde igurube a na-apụta ná mbido udu mmiri. Ha pụta, ha na-anọ naanị izu ole na ole. N’ime izu ole na ole ahụ ha pụtara, ha na-ewe iwere, na-efegharị, na-ebe ubé na-adachi ntị, ndị nke nne eyie àkwá, ha niile anwụọ. Otu ihe dị́ ịtụnanya bụ na mgbe ụmụ ha na-apụta bụ ma o ruo afọ iri na atọ ma ọ bụ afọ iri na asaa. Olee ebe ha na-anọ n’ime oge ahụ niile?

Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ bụ ibu ụzọ ghọta otú ndụ igurube a si aga. N’ime ihe dị ka otu izu igurube a pụtara, ndị nke oké na-agba ndị nke nne. Otu na-eyi àkwá ruru narị anọ ma ọ bụ narị isii n’osisi. Ọ naghị adị anya igurube niile ahụ pụtaranụ anwụọ. N’ime izu ole na ole na-esonụ, ụmụ ha na-esi n’àkwá ndị ahụ rịpụta, rịkpuo n’ime ala. Ha na-anọ n’ala ahụ na-ata ma mgbọrọgwụ osisi ma mgbọrọgwụ ahịhịa dị iche iche ruo ọtụtụ afọ. O ruo afọ iri na atọ ma ọ bụ afọ iri na asaa, ha na-eto, pụta, ndị ọhụrụ ahụ pụtaranụ anọọkwa izu ole na ole nwụọ.

Otu akwụkwọ kwuru na otú a ndụ igurube a si aga na-agbagwoju ndị ọkachamara anya kemgbe ọtụtụ narị afọ. Akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị ọkachamara ka na-agbasi mbọ ike ka ha chọpụta ihe mere ndụ igurube a ji dị otú a. Ha ahụtụbeghị ihe ọzọ ndụ ya si otú a aga.

Gịnị ka i chere? Otú a ndụ igurube a si aga ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?