Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Aji Dị Anụ Sea Otter n’Ahụ́

Aji Dị Anụ Sea Otter n’Ahụ́

ỌTỤTỤ anụmanụ bi ná mmiri jụrụ ezigbota oyi na-enwekarị abụba dị n’okpuru akpụkpọ ahụ́ ha na-eme ka ahụ́ ha na-ekpere ọkụ. Ma otu anụmanụ aha ya bụ sea otter nwere ihe ọzọ na-enyere ya aka ime ka ahụ́ ya na-ekpere ọkụ. Ọ bụ ajị ndị juru ya n’ahụ́.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Anụmanụ a nwere ajị karịa anụmanụ ọ bụla ọzọ. O gwuwe mmiri, ajị ya na-ejide ụfọdụ ikuku ka ha nọrọ nso n’akpụkpọ ahụ́ ya. Ikuku ahụ na-enye aka gbochie mmiri oyi imetụ ya n’ahụ́ ka oyi ghara ịba ya ahụ́.

Ndị sayensị na-atụ anya isi n’ajị anụmanụ a mụta ihe ndị ga-abara ha uru. Iji chọpụta ụdị uwe ga-akacha egbochi mmiri, ha emepụtala uwe dị iche iche nwere ajị. Ha na-agbanwe ajị ole dị n’uwe ndị ahụ, ma ọ bụkwanụ otú ha hà n’ogologo iji mara nke ga-akacha egbochi mmiri. Ha chọpụtara na “ajị na-akacha egbochi mmiri ma ọ bụrụ na o ju eju, dịkwa ezigbo ogologo.” N’ihi ya, ọ bụ ajị juru anụmanụ a n’ahụ́ mere na o nweghị ihe mmiri jụrụ oyi na-eme ya.

Ndị na-eme nchọpụta na-atụ anya na ihe a ha chọpụtara gbasara ajị anụmanụ a nwere ike inyere ha aka imepụta ákwà ndị ga na-egbochi mmiri nke ọma. Nchọpụta a nwere ike ime ka ụfọdụ chee na ọ ga-aka mma ka ndị na-egwu mmiri ná mmiri ndị jụrụ ezigbo oyi na-eyi uwe ndị nwere ọtụtụ ajị otú ahụ anụmanụ a nwere.

Gịnị ka i chere? Otú a ajị dị n’ahụ́ anụmanụ a si na-enyere ya aka igbochi mmiri jụrụ oyi ịbanye ya n’ahụ́ ọ̀ nọkatara dịrị? Ka è kere ya eke?