Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Ga-enwetali Amamihe

Ị Ga-enwetali Amamihe

“Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) N’amaokwu a, okwu bụ́ “si n’ike mmụọ nsọ” pụtara na Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, tinyere echiche ya n’obi ndị dere Baịbụl.

Chineke Na-asị Gị Bịa Ka O Nye Gị Amamihe Ya

“Mụnwa, bụ́ Jehova, . . . na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, na-ezikwa gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso. Biko, na-eme ihe m nyere n’iwu. Ọ bụrụ na ị na-eme ya, udo ị ga-enwe ga-aha ka osimiri, ị gaghịkwa akwụsị ime ezi omume otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri.”​—AỊZAYA 48:​17, 18.

Were ya na ọ bụ gị ka Chineke na-agwa okwu ndị a. Ọ chọrọ ka i nwee udo nke obi, nakwa ka ị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-enyekwara gị aka inweta ihe ndị a.

Ị Ga-enwetali Amamihe Chineke

‘A ga-ekwusa ozi ọma ná mba niile.’​—MAK 13:10.

Nkwa Jehova kwere na ahụhụ ga-akwụsị, na ụwa ga-aghọ paradaịs, nakwa na ndị nwụnahụrụ anyị ga-adị ndụ ọzọ socha ‘n’ozi ọma’ ahụ. Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma a si na Baịbụl n’ụwa niile.