Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Ihe Na-enyere Ịyọ́rọ́ Aka Iferu Ebe Dị Anya

Ihe Na-enyere Ịyọ́rọ́ Aka Iferu Ebe Dị Anya

OTÚ nnụnụ a si efe dị egwu. O nwere ike iji naanị abalị asatọ fee ihe ruru puku kilomita iri na otu.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Ndị na-eme nchọpụta kwuru na e nwere ihe ndị dị n’ụwa ndị na-enyere nnụnụ a aka iferu n’ebe dị anya. Ha sị na o yiri ka è nwere ihe a rụnyere ya n’ụbụrụ nke na-ezi ya ụzọ. Ọ ga-abụ na anyanwụ na-enyere ya aka ife n’ehihie, kpakpando ana-enyere ya aka n’abalị. O nwekwara ike ịbụ na nnụnụ a na-ama mgbe ifufe na-efega n’ebe ọ na-aga ka o nwee ike soro ya. Ma, otú nnụnụ a si eferu ebe dị anya na-eju ndị ọkachamara anya. Otu ọkachamara kwuru, sị: “M na-amụ gbasara nnụnụ a kemgbe afọ iri abụọ, ma amatabeghị m ihe na-enyere ya aka.”

Gịnị Ka I Chere? Ihe a na-enyere nnụnụ a aka iferu ebe dị anya ọ̀ nọkatara dịrị, ka è kere ya eke?