Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Ga-enyere Ndị Agadi Aka

Ihe Ndị Ga-enyere Ndị Agadi Aka

Ihe Ndị Ga-enyere Ndị Agadi Aka

Ọ BỤRỤ na otu nwatakịrị nwaanyị nọ na-agbagharị gburugburu ụlọ ha, ma daa ada na mberede, ọ ga-ebili ozugbo ahụ, o nweghịkwa ihe ga-eme ya. Ma ọ bụrụ agadi nwaanyị dara ada n’ụlọ ya, o nwere ike gbajie úkwù, e buga ya ụlọ ọgwụ, waa ya ahụ́, ọ ga-ewekwa ọtụtụ ọnwa tupu ya agbakechaa. N’ihi ada ahụ ọ dara, ụjọ ịgagharị agagharị ga na-atụzi ya, nke ahụ ga-emekwa ka ahụ́ ghara ịgbasi ya ike.

N’otu mba, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị rurula iri afọ isii na ise, ma ọ bụ ndị gaferela ya, na-ada ada kwa afọ. Nke ka njọ bụ na a bịa n’ọnwụ ndị agadi na-anwụ n’ihi ahụ́ ha merụrụ, nke kacha egbu ha bụ ahụ́ ha na-emerụ ma ha daa ada. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo banyere ndị agadi, sị: “Ihe dị elu na-atụzi ha egwu, ihe na-emenye ụjọ adịrịkwa n’ụzọ.”—Ekliziastis 12:5.

Ọ bụ eziokwu na nká anaghị ekwe mmadụ mee ihe ụfọdụ, e nwere ihe ndị agadi nwere ike ime iji hụ na ha emerụghị ahụ́ nakwa iji hụ na ndụ ha kara mma. Otu ihe ha ga-agbalị mee bụ ịhụ na ahụ́ gbasiri ha ike otú o kwere mee. Ihe ọzọ ha ga-eme bụ iwepụ ihe ọ bụla nwere ike imerụ ha ahụ́ n’ụlọ ha.

Hụ na Ahụ́ Gbasiri Gị Ike

Anyị katawa ahụ́, o nwere ike isiri anyị ike ịghọtacha otú ihe ụfọdụ dị, anya anyị nwere ike ọ gaghị na-ahụcha ihe nke ọma, ụkwụ na aka anyị ana-amatụkwa jijiji. Ma ọ bụrụ na anyị na-emega ahụ́ mgbe niile ma na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, ọ ga-enyere anyị aka. Nita, onye ọrụ ya bụ ịkụziri ndị ọrịa otú e si emega ahụ́, sịrị: “Imega ahụ́ dị mkpa, n’ihi na ọ na-enyere ndị agadi aka ka ụkwụ na-esi ha ike n’ala, ka ike na-adị ha, nakwa ka ahụ́ na-agbasi ha ike.”

Otu akwụkwọ si n’aka Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Ijere Ọha Ozi ná mba Amerịka kwuru, sị: “Ma ahụ́ ọ̀ gbasiri ndị agadi ike ma ọ̀ bụ na ahụ́ agbasighị ha ike, e nwere ọtụtụ uru imega ahụ́ na-abara ha. Ya bụrụgodị na ịkwụ ọtọ ma ọ bụ ịga ije na-esiri ha ike, ha ka nwere ike imega ahụ́ ma rite uru na ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na nsogbu ha ga-enwe ma ọ bụrụ na ha anaghị emega ahụ́ ga-aka nke ha ga-enwe ma ọ bụrụ na ha na-emega ahụ́.” * Imega ahụ́ ga-enyere ha aka ka ha ghara ịrịa ọrịa obi, ọrịa nkwonkwo, ọrịa ọkpụkpụ, nakwa ka obi ghara ịna-ajọ ha njọ mgbe niile. Ọ ga-eme ka ọbara ha na-erugharị nke ọma, nye aka mee ka nri na-agbari ngwa ngwa n’ahụ́ ha, nakwa ka ha na-ehi ụra nke ọma. Ọ ga-enyekwara ha aka ka obi na-esi ha ike nakwa ka ha na-adị garagara.

Ọ bụrụ na ị naghị emegabu ahụ́, ọ ga-adị mma ma i buru ụzọ gwa dọkịta gị tupu i bido imega ahụ́. Gwakwa dọkịta gị ma ọ bụrụ na ajụ ebuwe gị ma ọ bụ obi egbuwe gị mgbu mgbe ị na-emega ahụ́. N’eziokwu, ọ bụrụ na ajụ ebuwe gị ma ọ bụ obi egbuwe gị mgbu, ọ kacha mma ịchọ onye ga-akpọga gị ụlọ ọgwụ ozugbo. Echekwala na o nweghị ihe ọ bụ! Ndị dọkịta kwukwara na ọ dị mma ịga hụ dọkịta na-ahụ maka anya otu ugboro n’afọ ọ bụla.

A bịa n’ihe oriri, hụ na ị naghị eri nri ndị na-adịghị enye vitamin na ndị nke na-anaghị edozi ahụ́, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ọ dị mfe isi ha. Ọ dị ezigbo mkpa ka ndị mere agadi na-eri nri ndị nwere nnọọ vitamin D na calcium, bụ́ ihe ndị na-eme ka ọkpụkpụ gbasie ike. N’ihi ya, gbalịa na-eri ihe ndị dị ka ọka, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri na mmiri ara ehi. Ọ dị mma ịgwa dọkịta gị tupu ị malite iri ihe ndị ị na-adịghị eribu ma ọ bụ kwụsị iri ihe ndị ị na-eribu. Dọkịta gị nwere ike ịgwa gị nri ụfọdụ i nwere ike iriwe ma ọ bụ ndị nke i nwere ike izere, ka ọ ghara ịkpatara gị nsogbu.

E wezụga nke ahụ, hụ na ị na-aṅụ mmiri nke ọma. Mmiri na-akọkarị ọtụtụ ndị agadi n’ahụ́, nke ka nke, ndị naanị ha bi ma ọ bụ ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Ọ bụrụ na mmiri akọọ onye agadi n’ahụ́, o nwere ike ime ka onye ahụ na-adakarị ada, ka isi na-agba ya ghara ghara, ka nsị na-esiri ya ike ọnyụnyụ, ka akpụkpọ ahụ́ ya see alịghịlị karịa ka o kwesịrị, ka ọ dịrị ya mfe ibute ọrịa nje na-akpata, ma ọ bụdị kpatara ya ọnwụ.

Wepụ Ihe Ndị Nwere Ike Imerụ Gị Ahụ́ n’Ụlọ Gị

Ebe ọtụtụ ndị agadi na-adakarị ada bụ n’ụlọ ha. Ma ọ bụrụ na ị kpachara anya n’ihe ụfọdụ, ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-adakarị ada. Ka ị na-agụ ihe ndị na-esonụ, chebara ihe ndị dị n’ụlọ gị echiche ka ị mara ihe ndị ị ga-elebara anya.

Ebe ịsa ahụ́:

● Ala ya ekwesịghị ịna-amị amị ma mmiri wụsa ya.

● N’ebe a na-asa ahụ́, e kwesịghị idowe ihe ọ bụla nwere ike ịmịchara mmadụ. Ọ bụrụ na ị na-anọ n’oche asa ahụ́, dowe ihe ọ bụla i ji asa ahụ́ n’ebe aka gị ga-eru ha ngwa ngwa.

● Ọ dị mma ịrụnye ihe ndị ị ga-ejigide aka mgbe ị chọrọ isi n’oche ị nọ saa ahụ́ bilie ma ọ bụ mgbe ị chọrọ isi n’ebe ị nọ gaa mposi bilie. Ihe ndị ahụ a rụnyere kwesịrị isi ezigbo ike n’ebe a rụnyere ha. Hụkwa na ebe ị na-anọ aga mposi adịghị ala nke na ọ ga-esiri gị ike ịnọdụ na ya.

● Hapụ ọkụ ụfọdụ ka i jiri ha na-ahụ ụzọ n’abalị.

Steepụ:

● Ọ bụrụ na i bi n’ụlọ nwere steepụ, e kwesịrị ịhụ na o nweghị ihe a ghasasịrị na steepụ ahụ, hụ na e nweghịkwa ebe mebiri emebi na steepụ ahụ, nakwa na ọkụ e ji ahụ ụzọ dị ebe ahụ.

● Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, e kwesịrị inwe ebe abụọ a ga na-ejide aka na-arịgo ma ọ bụ na-arịda steepụ ahụ. E kwesịghị inwe ihe na-amị amị n’ala ebe ahụ, e kwesịkwara inwe ọkụ a ga-eji na-ahụ ụzọ ma a rịgowe ma ọ bụ rịdawa steepụ ahụ.

● Ịrịgo na ịrịda na steepụ nwere ike inyere ndị agadi aka ka ụkwụ na-esi ha ike n’ala. Ma ọ bụrụ na ụkwụ na-ama gị jijiji, naanị gị arịgokwala ma ọ bụ rịdata na steepụ.

Ụlọ ịrahụ ụra:

● Hụ na i nwere ohere ga-ezuru gị isi na-agafe n’akụkụ ihe ndina gị nakwa ihe ndị ọzọ dị n’ebe ị na-arahụ ụra.

● Debe oche nso ka i nwee ike nọrọ na ya mgbe ị na-eyiri uwe.

● Debe tọọchị ma ọ bụ lampụ n’akụkụ ebe i dina.

Usekwu:

● Akwasasịla ihe n’ebe ndị ị na-edebe ihe n’usekwu gị, ka o nwee ike dịrị gị mfe idebe ihe ndị ị zụtara i ji esi nri.

● E kwesịghị iji ihe na-amịchara mmadụ mee ala ebe ị na-anọ esi nri ma ọ bụ jiri ihe nwere ike ịmị amị hichaa ebe ahụ.

● Kọbọd ị na-etinye ihe ekwesịghị ịdị elu nke na ị ga-enwe ihe ị ga-arịgo na ya tupu i were ihe ị chọrọ. O kwesịghịkwa ịdị ala nke ukwuu nke na ihulata ala were ihe ga na-enye gị nsogbu. Anọkatakwala rịgoro elu oche mgbe ị chọrọ iwedata ihe!

Ihe ndị ọzọ:

● N’abalị, agbanyụchala ọkụ niile dị n’ụlọ gị. Hapụ ụfọdụ ka i jiri ha na-ahụ ụzọ mgbe ị ga-aga ịnyụ mamịrị, ma ọ bụ mgbe ị ga-aga ebe ndị ọzọ.

● Ọ dị mma inwe mkpara ma ọ bụ mkpọ ị ga-eji na-agagharị n’abalị mgbe ụra ka dịtụ gị n’anya.

● Oche ndị i ji anọdụ ala kwesịrị ịbụ oche ụkwụ ha siri ike, ha ekwesịghị inwe ihe ga-eme ka ha na-agbagharị agbagharị. Ha kwesịkwara inwe ebe ị ga-edokwasị aka, ha ekwesịghị ịdị ala ma ọ bụ dị elu nke na ịnọdụ ala ma ọ bụ ibili ọtọ ga na-esiri gị ike.

● E nwehaala ebe mebiri emebi n’ihe e ji mee ala ụlọ gị, mezie ya, gbanwee ya ma ọ bụ wepụ ya ka ọ ghara ịkwatu gị. Eriri eletrik ndị dị n’ụlọ gị kwesịrị ịdị n’akụkụ ahụ́ ájá, o kwesịghị ịdị n’ebe ndị e si agafe agafe ka ọ ghara ịkwatu mmadụ.

● Ọ bụrụ na kapet dị n’ala ụlọ gị, e kwesịghị ịtụkwasị ihe nwere ike ịmịchara mmadụ n’elu ya. Ọ bụrụ na e nwere ihe i ji etichasị ụkwụ tupu ị banye n’ime ụlọ, tụkwasị ya n’ala nkịtị ebe na-enweghị ihe ga-eme ka ọ na-amị amị, hụkwa na o nwere ihe e ji madosie ya ike n’ala.

● Eyila akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ sịlịpas ike ya kwọchara akwọcha, nke okpuru ya na-amị amị ma ọ bụ nke ka ụkwụ gị. Eyikwala akpụkpọ ụkwụ okpuru ya dị elu.

● E nwere ọgwụ ndị na-eme ka ajụ na-ebu mmadụ ma ọ bụ ka ụkwụ na-ama mmadụ jijiji ma ọ ṅụọ ya. Ọ bụrụ na ụdị ihe ndị a ebido ime gị ma ị ṅụọ ọgwụ ụfọdụ, gwa dọkịta gị ozugbo. O nwere ike ịgbanwere gị ọgwụ ahụ ma ọ bụ gwa gị ka iselata aka n’otú i si aṅụ ya.

E nwee ihe mebiri n’ụlọ gị ma ọ bụ ihe e kwesịrị ilebara anya, ma gịnwa agaghị emeli ya n’onwe gị, gwa ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị banyere ya, ma ọ bụkwanụ kpọọ ndị na-arụzi ihe ahụ ka ha lebara ya anya. Asịkwala mgbe e mechara.

Otú Ndị Ọzọ Nwere Ike Isi Nye Aka

Ọ bụrụ na i nwere nne, nna, nne nne, nna nna, ma ọ bụ ndị enyi merela agadi, gịnị ka i nwere ike imere ha ka ha ghara ịda ada ma merụọ ahụ́? Otu ihe i nwere ike ime bụ gị na ha ilebara ihe ndị a a kọwara n’isiokwu a anya ma nyere ha aka imezi ihe ndị na-adịghị otú o kwesịrị. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, i nwere ike isiri ha nri na-edozi ahụ́ otu ugbo ma ọ bụ ugboro abụọ n’izu. Ọ dịkwa mkpa ka ndị agadi na-emega ahụ́ mgbe niile. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i wepụta oge gị na ha ga-eji na-agagharịtụ ma ọ bụdị mee ihe ndị ọzọ ga-eme ka ha megaa ahụ́? Obi ga-atọ ọtụtụ ndị agadi ụtọ ịpụ gagharịtụ ma onye ha ma na ọ ga-elekọta ha soro ha. Ná mba ụfọdụ, gọọmenti na-akpọnye ndị agadi ndị nọọsụ ga-abịa na-elekọta ha n’ụlọ.

Onye kere anyị, bụ́ onye a kpọrọ “Onye Ochie ahụ,” chọrọ ka anyị na-asọpụrụ ndị agadi, karịchaa ndị nne na nna anyị merela agadi. (Daniel 7:9) Chineke nyere anyị iwu, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ọpụpụ 20:12) O kwukwara, sị: “Ị ga-ebiliri onye isi awọ́, sọpụkwara onye mere agadi, tụọkwa egwu Chineke gị.” (Levitikọs 19:32) N’eziokwu, ịkwanyere ndị agadi ùgwù na-egosi na anyị na-atụ egwu Chineke! Ọ bụrụkwa na ndị agadi ana-egosi na obi dị ha ụtọ maka aka a na-enyere ha, ọ ga-eme ka ndị ọzọ nwee obi ụtọ inyekwuru ha aka. Anyị ekwesịghị iwere inyere ndị agadi aka ka ibu arọ. Anyị kwesịrị iji obi ụtọ na-enyere ha aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Teta! June 8, 2005, kọwakwuru uru imega ahụ́ bara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 23]

IHE NDỊ AGADI NWERE IKE IJI KPỌỌ KA A BỊA NYERE HA AKA

Ná mba ụfọdụ, ndị agadi nwere ike inweta otu obere ngwá eletrọniks ha nwere ike iji kpọọ ka a bịa nyere ha aka ma ihe gbata gbata mee, dị ka ma ha daa ada merụọ ahụ́. Naanị ihe ha ga-eme bụ ịpị bọtịn dị na ngwá eletrọniks ahụ. Ha nwere ike ịna-anya ihe ahụ n’olu na-aga ebe ọ bụla ha na-aga ma ọ bụ gbara ya n’aka. Ọ bụrụ na ụdị ihe a dị ná mba unu, i nwere ike inweta ya, karịchaa, ma ọ bụrụ naanị gị bi.