Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọnwụ Ọ̀ Bụ Ebe Okwu Biri?

Ọnwụ Ọ̀ Bụ Ebe Okwu Biri?

Ọnwụ Ọ̀ Bụ Ebe Okwu Biri?

NA February 1987, otu nwoke dị afọ iri asatọ na ise họọrọ ịkwụsị ọgwụgwọ a na-agwọ ya ọrịa imeju o nwere, bụ́kwanụ ọgwụgwọ ji ya ndụ. Ka izu abụọ gachara, ọ nwụụrụ onwe ya ka naanị otu nwa nwoke o nwere nọ ya n’akụkụ.

Oge ikpeazụ ahụ ha abụọ nọkọtara ọnụ nyere ha ohere ichebakwuru isiokwu ha kwuburula banyere ya echiche: Onye nwụrụ anwụ ò nwere ike ịdị ndụ ọzọ? Nwoke ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ, bụ́ onye gara mahadum, ekweghị na Baịbụl. Ozizi nke mmadụ isi n’enwe pụta abaala ya n’ọkpụkpụ, ihu abụọ nke ndị okpukpe na-agbakasịkwa ya ahụ́. O kweere na e nweghị onye nwere ike ịmata ma Chineke ọ̀ dị adị ma ọ bụ na ọ dịghị.

Ebe ọ bụ na nwa ya nwoke chọrọ ịkasi nna ya obi ma mee ka o nwee olileanya, ọ gwara nna ya ihe mere onye nwụrụ anwụ nwere ike iji dị ndụ ọzọ. Ka nna ya na-achọ ikubi ume, o kwetara na ọ ga-amasị ya ịdị ndụ ọzọ, gbasiekwa ike ọzọ.

Nkasi Obi n’Ọnụ Ọnwụ

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, ma ọ bụrụkwa na ọ bụghị mmadụ niile, ga-achọ ịdị ndụ ọzọ ma ọ bụrụ na ha ga-enwe ezi ahụ́ ike, gbasiekwa ike n’ụwa ebe udo na-achị. Ụmụ mmadụ adịghị ka ụmụ anụmanụ, bụ́ ndị Baịbụl kwuru na ha ‘adịghị eche echiche.’ (2 Pita 2:12) Anyị na-eli ndị nwụnahụrụ anyị. Anyị na-eche banyere ọdịnihu. Anyị achọghị ime agadi, ịrịa ọrịa, ma nwụọ. Ma, ihe ndị a na-eme anyị.

Obi na-ajọ anyị njọ mgbe ọnwụ ruwere anyị nso, ma ọ bụ ọnwụ nke anyị ma ọ bụ nke onye anyị hụrụ n’anya. Ma, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị jiri obi ike na-eche banyere ọnwụ mgbe o kwuru, sị: “Ọ dị mma ịga n’ụlọ iru uju karịa ịga n’ụlọ oriri.” O kwukwara, sị: “Onye dị ndụ kwesịkwara iburu ya n’obi.” (Ekliziastis 7:2) Olee ihe mere anyị kwesịrị iji buru ọnwụ n’obi ma ọ bụ chesie echiche ike banyere ya?

Otu ihe kpatara ya bụ na e kere anyị inwe ọchịchọ nke ịdị ndụ n’udo na n’obi iru ala. Ọnwụ—nke pụtara adịghị adị—adịghị onye ọ na-agụ agụụ. Ọ na-esiri anyị ike ikweta na anyị ga-anwụ anwụ, ma ọ bụrụdị na ọ dị onye ga-ekweta ekweta. Baịbụl kọwara ihe kpatara ya: “[Chineke etinyewo] mgbe ebighị ebi n’obi ha.” (Ekliziastis 3:11) Ọ na-agụ anyị agụụ ịdị ndụ—ọ bụghị ịnwụ anwụ. Chegodị banyere ya: Agụụ ahụ ọ̀ ga-esi ike otú ahụ ma ọ bụrụ na nzube mbụ nke Onye Okike anyị abụghị ka anyị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Ànyị nwere ike ịdị ndụ ọzọ ma nwee ezi ahụ́ ike na obi ụtọ?

Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere

N’afọ gara aga, magazin bụ́ AARP The Magazine bụ́ nke Òtù Jikọtara Ndị Lara Ezumike Nká n’America bipụtara bu isiokwu bụ́ “Onye Nwụrụ Anwụ Ịdị Ndụ Ọzọ.” Ajụjụ ọnụ a gbara ọtụtụ ndị gaferela afọ iri ise gosiri na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ atọ n’ime mmadụ anọ ọ bụla n’ime ha kwenyeere okwu bụ́, ‘Ekweere m na onye nwụrụ anwụ ga-adịli ndụ ọzọ.’” Ma, magazin ahụ kwukwara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla n’ime ha kwenyeere okwu bụ́, “M kweere na m nwụọ, nke m agaala.” Ma nke ahụ ọ̀ bụ nnọọ ihe ndị mmadụ chọrọ ikwere?

N’otu isiokwu ahụ, a kọrọ na Tom, bụ́ onye Katọlik si New York, kwuru, sị: “Ị ma na ha na-akụzi na mmadụ na-adị ndụ ma ọ nwụchaa. Naanị ihe m na-ekwu bụ na ihe ndị mmadụ na-akụzi ha ka ájá. Ma, mmadụ aghaghị iji aka ya kpebiere onwe ya ihe ọ ga-ekwere. M na-aga Mas. M na-ebi ndụ m ka à ga-asị na mmadụ ga-adị ndụ ọzọ ma ọ nwụchaạ, ma ekweghị m na ọ bụ eziokwu. Ya bụrụkwanụ eziokwu, ọ magbuolanụ onwe ya.”

Dị ka Tom, ọtụtụ ndị na-enwe obi abụọ otú nna ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite na-enwe, bụ́ onye na-agwakarị nwa ya nwoke, sị, “Ikwere ihe okpukpe na-akụzi dịịrị onye na-agaghị akatali obi ma ọnwụ bịa.” Ma, dị ka ya na ndị ọzọ na-enwe obi abụọ ghọtara, ikwere na e nwere Onye Okike kasị onye ọ bụla ike na-eme ka anyị nwee ike ịghọta ọrụ ebube ndị siri nnọọ ike nghọta.

Dị ka ihe atụ, naanị izu atọ nwaanyị tụrụsịịrị ime, nwa ahụ a tụụrụ ime ya ọhụrụ na-amalite inwe mkpụrụ ndụ ụbụrụ. Mkpụrụ ndụ ndị a na-amalite ịmụba n’ike n’ike, mgbe ụfọdụ n’ime otu nkeji, ihe dị ka narị puku abụọ na iri puku ise na-apụta! N’ọnwa itoolu ọzọ, a na-amụpụta nwa ọhụrụ nke nwere ụbụrụ nke nwere ikike ịmụta ihe. Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ James Watson kpọrọ ụbụrụ mmadụ “ihe kasị dị mgbagwoju anya anyị chọpụtarala n’eluigwe na n’ụwa.”

Mgbe ị na-atụle ihe ndị dị mgbagwoju anya dị ka nke a, ọ̀ na-eju gị anya dị ka ọ na-eju ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ? Ịtụgharị uche n’ihe ndị dị otú ahụ ò nyerela gị aka ịmata azịza nke ajụjụ a otu nwoke jụrụ ogologo oge gara aga: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” Nwoke ahụ ji obi ike zaa Chineke, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.”—Job 14:14, 15.

Ọ ga-adị nnọọ mma ma anyị tụlee ihe ndị mere anyị ji kwere na mmadụ nwere ike ịdị ndụ ọzọ mgbe ọ nwụsịrị.