Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mgbe Chi Jiri n’Ehihie”

“Mgbe Chi Jiri n’Ehihie”

“Mgbe Chi Jiri n’Ehihie”

DỊ KA ONYE EDEMEDE TETA! NÁ MBA BENIN SI KỌỌ

MGBE chi jisịrị n’ehihie na March 29, 2006, n’echi ya, akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị na Ghana, bụ́ Daily Graphic, nwere isiakụkọ bụ́ “Chei! Chi Jiri n’Ehihie Juru Ọtụtụ Nde Mmadụ Anya.” Chi ojiji ahụ, nke malitere n’ebe ọwụwa anyanwụ Brazil, ji ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii kwa awa gafere Oké Osimiri Atlantic banye ná mba ndị dị n’ikperé mmiri ahụ, bụ́ ndị dị ka Ghana, Togo, na Benin malite n’ihe dị ka n’elekere asatọ nke ụtụtụ. Olee ihe ndị bi ná mba ndị a dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa ga-atụ anya ya?

Mgbe ikpeazụ chi jiri na Ghana n’ehihie bụ n’afọ 1947. Theodore, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na asaa n’oge ahụ kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị dị ndụ n’oge ahụ ahụtụbeghị ebe chi jiri n’ehihie, n’ihi ya, ha amaghị kpọmkwem ihe kpatara ya. N’ihi nke a, ndị mmadụ kpọrọ ya ‘mgbe chi jiri n’ehihie.’”

Ọkwa A Mara Banyere Ya

Ndị ọchịchị mara ọkwa ebe niile gwa ndị mmadụ na iji anya ha nkịtị ele anyanwụ mgbe ahụ chi na-achọ iji n’ehihie pụrụ imebi ha anya. Ọmarịcha akwụkwọ a mapawara n’ebe dị iche iche na Togo dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị, sị: “Kpachara anya! I nwere ike ikpu ìsì!”

Ndị ọrụ gọọmentị gbara nnọọ ndị mmadụ ume ime otu n’ime ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ ịnọ n’ime ụlọ ha ma lere ihe ahụ na-emenụ na televishọn. Nke abụọ abụrụ na ha nọrọ n’èzí, ka ha kpuru enyo anya ndị pụrụ iche e mepụtara maka ile anya n’anyanwụ. Ọtụtụ nde mmadụ gwunyere anya na televishọn na kọmputa iji hụ ọmarịcha onyoonyo ndị ahụ. Ma, a gaghị eji ihe a hụrụ na televishọn na kọmputa tụnyere oké obi ụtọ ndị nọ n’èzí na-enwe ka ha na-eche mgbe ahụ chi ga-eji n’ehihie na mgbe o jiwere. Ka anyị laghachi n’ụbọchị ahụ ihe ahụ mere.

Onye Ọ Bụla Nọ Na-atụsi Anya Ya Ike

N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ebe niile dị otú ọ na-adị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa—anwụ nọ na-acha, ihu igwe gbachapụkwara agbachapụ. Chi ọ̀ ga-emecha jie n’ehihie? Ka oge ahụ a mara ọkwa ọ ga-eji mee na-eru, ndị nọ n’èzí kpuuru enyo anya ha ma lewe anya n’eluigwe. Ụfọdụ ji ekwe ntị ha na-ajụ ndị nọ n’ebe ọzọ ihe ha na-ahụ.

Ọnwa, bụ́ nke nọ n’ebe dị narị puku kilomita atọ na puku iri ise n’elu, na-eru nnọọ anyanwụ nso n’ike n’ike, ọ bụ ezie na a hụghị ya anya ná mmalite. N’otu ntabi anya, ọ bịara dị ka ihe na-eji oji nọ n’ọnụ ọnụ anyanwụ, malite ikpuchi anyanwụ. Onye ọ bụla hụrụ ya na-eji obi ụtọ akpọ ibe ya ka ọ bịa lere.

Ruo otu awa ihe ahụ malitere ime, ndị na-ekiri ihe ahụ na-emenụ ahụghị ihe ọ bụla na-egosi na chi ga-eji n’ehihie. Ma, ka ọnwa malitere kpuchiwe anyanwụ, ihu igwe malitere ịgbanwe. Ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ malitere gbachiwe. Oyi malitere ịtụ ndị mmadụ. Ka chi nọ na-ejikwu n’ụtụtụ ahụ, ọkụ ndị na-agbanye onwe ha ma chi jie malitere inwu. Ọ bụzi mmadụ ole na ole ka a na-ahụ n’okporo ụzọ. Ndị mmadụ mechiwere ụlọ ahịa ha. Ụmụ nnụnụ kwụsịrị ịbụ abụ, ụmụ anụ chọwakwara ebe ha ga-anọ hie ụra. Ọchịchịrị nọ na-agba. Chi mechaziri jie, ebe niile adaakwa jụụ.

Ọ Dịghị Onye Ga-echefu Chi Ojiji Ahụ

Kpakpando pụtasịrị. Ọ bụzi naanị ọdụ anyanwụ ka a na-ahụ gburugburu ọnwa ahụ nke na-ejizi oji. Ìhè ndị a na-akpọ Baily’s Beads * pụtara gburugburu ọnwa ka anyanwụ na-achakwasị ebe ndị na-adịghị larịị n’ọdụ ọnwa. Ìhè ahụ gbara ọnwa gburugburu nọ na-egbukepụ egbukepụ. Ìhè ọkụ ndị na-achatụ anụnụ anụnụ na odo odo chabara n’ime anyanwụ. Otu onye hụrụ ya tiri mkpu, sị: “Ọ bụ ihe kasị eju anya m hụtụrụla—ọ mara mma dị egwu.”

Chi ojiji ahụ nọruru ihe dị ka nkeji atọ. Mgbe ahụ, anyanwụ pụtaghachiwere. Ọtụtụ ndị na-ekiri ya nọ na-akụrụ ya aka ma na-eti mkpu ka ọ na-apụta. Ihu igwe gbachapụwara, kpakpando banyeghachikwara. Ebe niile maliteghachiri inwu gbaa.

Ọnwa bụ “onye akaebe kwesịrị ntụkwasị obi nke nọ na mbara igwe.” N’ihi ya, e nwere ike ikwu mgbe ọ ga-ekpuchi anyanwụ ọtụtụ narị afọ tupu ya emee. (Abụ Ọma 89:37) O were ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ isii tupu chi ejie ọzọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa n’ehihie. Nke ọzọ a ga-anọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa hụ ga-eme n’afọ 2081. Ma eleghị anya, ndị bi n’ebe ọzọ n’ụwa ga-ahụ chi ojiji ọzọ n’ehihie tupu mgbe ahụ.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 13 Ebe e si nweta aha ahụ bụ n’aha onye Britain na-enyocha mbara igwe bụ́ Francis Baily, bụ́ onye dekọrọ mgbe mbụ a hụrụ ụdị ìhè ahụ mgbe chi jiri n’ehihie n’afọ 1836.

[Igbe na Foto dị na peeji nke 29]

Ọ̀ Bụ Ọnwa Ikpuchi Anyanwụ Mere Chi Ji Jie n’Ehihie n’Oge Jizọs Nwụrụ?

Mak 15:33 kwuru, sị: “Mgbe o ruru oge awa nke isii, ọchịchịrị gbachiri ala ahụ dum ruo n’oge awa nke itoolu.” Ọchịchịrị a were awa atọ, malite n’ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie ruo n’elekere atọ nke ehihie, bụ ọrụ ebube. O nweghị ike ịbụ na ihe mere chi ji jie n’ehihie n’oge ahụ bụ na ọnwa kpuchiri anyanwụ. Nke mbụ, oge kasị ogologo chi jirila n’ụwa n’ehihie n’ihi ọnwa ikpuchi anyanwụ bụ nkeji asaa na ọkara. Nke abụọ, Jizọs nwụrụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Naịsan a na-eji ọnwa nkịtị agụ. Ihe e ji amata ụbọchị mbụ nke ọnwa Naịsan bụ ụbọchị ọnwa ọhụrụ pụtara, bụ́ mgbe ọnwa na-anọ n’agbata ụwa na anyanwụ, bụ́kwa nke nwere ike ime ka chi jie n’ehihie. N’abalị iri na anọ nke ọnwa Naịsan, ọnwa agbaala anyanwụ gburugburu ruo ọkara. N’oge ahụ, ụwa na-anọ n’agbata anyanwụ na ọnwa, bụ́ mgbe ọnwa na-egbukepụ nnọọ ìhè sitere n’anyanwụ kama ikpuchiwe anyanwụ. N’ihi ya, anyị na-ahụ ọnwa gbazuru agbazu n’oge ahụ, bụ́ oge dabara adaba iji cheta ọnwụ Jizọs.

[Foto]

Abalị iri na anọ nke ọnwa Naịsan na-abụrịrị n’ụbọchị ọnwa gbazuru agbazu ma ọ bụ gburugburu oge ahụ

[Ihe Osise/Map Foto dị na peeji nke 28 na 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Otú chi ojiji ahụ si gaa

⇧ AFRICA

BENIN ●

TOGO ●

GHANA ●

[Ebe E Si Nweta Map]

Map: Dabere na NASA/Visible Earth imagery

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbe ahụ chi jiri n’ehihie na March 29, 2006

[Foto dị na peeji nke 28]

Enyo anya pụrụ iche ndị mmadụ kpu mere ka ha nwee ike iji anya ha hụ mgbe ọnwa kpuchiri anyanwụ