Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Kwesịrị Ịdị Na-egwu Egwuregwu Kọmputa?

M̀ Kwesịrị Ịdị Na-egwu Egwuregwu Kọmputa?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

M̀ Kwesịrị Ịdị Na-egwu Egwuregwu Kọmputa?

EGWUREGWU Kọmputa Abụghị Naanị Ntụrụndụ ọgbara ọhụrụ. Ha na-eme ka i tinye nkà gị n’ọrụ ma na-enye aka ibelata owu ọmụma. Ma ha na-eme ihe karịrị nke ahụ. Egwuregwu kọmputa nwere ike ime ka ị dịkwuo nkọ, nnyocha ndị e merela na-egosikwa na egwuregwu ndị a na-eme ka mmadụ mụta ilekwasị ihe anya ruo ogologo oge. Ụfọdụ n’ime ha nwedịrị ike ime ka ị mụtakwuo mgbakọ na mwepụ, mụtakwuokwa ịgụ ihe. E wezụga nke ahụ, o nwere ike ịbụ na ihe onye ọ bụla na-ekwu banyere ya n’ụlọ akwụkwọ unu bụ egwuregwu kọmputa ka pụtara ọhụrụ. Ọ bụrụ na i gwuola egwuregwu ahụ, ị ga-enwe ihe ị ga-akọrọ ụmụ akwụkwọ ibe gị.

N’ezie, ọ bụ ndị mụrụ gị ka ọ dị n’aka ikpebi ma hà ga-ekwe gị gwuo egwuregwu kọmputa. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ọ bụrụ na ha ekwe gị gwuo ya, i nwere ike ịchọta egwuregwu dị ụtọ na nke dị mma ogwugwu. Ma, olee ihe mere o ji dị nnọọ mkpa ka ị kpachara anya?

Nsogbu Ha!

Brian, bụ́ onye dị afọ iri na isii kwuru, sị, “Egwuregwu kọmputa na-atọ ụtọ, ọ bụkwa ebe a nọ.” Ma o nwere ike ịbụ na ị ma na ọ bụghị egwuregwu niile dị mma. Brian kwuru, sị, “Mgbe ị na-egwu egwuregwu ndị ahụ, ị na-enwe ike ime ihe ndị ọ na-adịghị mgbe ị ga-eme ha na mmadụ—ihe m na-ekwu bụ, ihe ndị ị na-agaghị eme ma ghara ịba ná nsogbu.” Olee ụdị àgwà egwuregwu ndị a na-agba ndị na-egwu ha ume ka ha na-akpa?

Ọtụtụ egwuregwu na-akwado nnọọ ime omume rụrụ arụ, ịkpọ iyi, na ime ihe ike—bụ́ omume ndị Baịbụl katọrọ. (Abụ Ọma 11:5; Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Kọlọsi 3:8) Ụfọdụ egwuregwu na-akwado anwansi. Adrian, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, kwuru na otu egwuregwu na-ewu ewu na-egosi “ebe ndị òtù ọjọọ na-alụ agha, ebe a na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ebe a na-enwe mmekọahụ n’ezoghị ya ezo, okwu ndị rere ure, oké ime ihe ike, ọbara, na ihe ike ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́.” Egwuregwu ọhụrụ ọ bụla e wepụtara na-akakwa ndị bu ya ụzọ njọ. James, bụ́ onye dị afọ iri na itoolu, kwuru na mmadụ na ndị ọzọ nwere ike igwu egwuregwu ndị kasị ewu ewu n’ime egwuregwu ndị a n’Intanet. Nke a emeela ka egwuregwu kọmputa ghọọ ihe ọzọ. James kwuru na “i nwere ike iji kọmputa dị n’ụlọ gị maa ndị nọ n’akụkụ ọzọ nke ụwa aka n’egwuregwu ndị a.”

Egwuregwu kọmputa ebe onye na-egwu ya nwere ike ịghọ otu n’ime ndị nọ n’egwuregwu ahụ ewuwela nnọọ ewuwe. N’egwuregwu ndị a, ndị na-egwu ya na-emepụta ndị ọzọ ga-eso n’egwuregwu ahụ na kọmputa—ma hà bụ ụmụ mmadụ, ụmụ anụmanụ, ma ọ bụ ha abụọ—bụ́ ndị ga-ebi n’ụwa e kere na kọmputa, bụ́ nke ọtụtụ puku ndị ọzọ so n’egwuregwu ahụ bi na ya. Ụwa kọmputa a na-enwe ụlọ ahịa, ụgbọala, ụlọ, ebe a na-agba egwu, ụlọ ndị akwụna—n’ezie, ọ dị nnọọ ka ụwa anyị a. Ndị na-egwu egwuregwu ndị a na-enwe ike izirịta onwe ha ozi ka ndị ahụ ha ji kọmputa kepụta na-asọrịta mpi.

Olee ihe na-eme n’ụwa kọmputa ndị ahụ? Otu onye nta akụkọ kwuru, sị: “Ndị mmadụ nkịtị na-eme ihe ndị ọ na-adịghị mgbe ha ga-eme ha, ma ọ bụ ndị ha na-enweghị ike ime, na mmadụ.” O kwukwara, sị: “Mmekọahụ na ịgba akwụna na-eju ebe niile.” Ndị na-egwu egwuregwu ndị a nwere nnọọ ike ime ka ndị ahụ ha kepụtara na kọmputa nwee mmekọahụ site naanị n’ịpị aka na bọtịn ole na ole na kọmputa ka ha na ndị mmadụ ibe ha ha na ha na-egwu egwuregwu ahụ ji kọmputa na-ekwurịta ihe banyere mmekọahụ. E wezụga nke ahụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ New Scientist kwuru na “mpụ, ndị agboro, ndị na-achọtara ndị mmadụ ndị akwụna, ndị wayo, ndị na-emepụta ngwá ahịa adịgboroja na ndị ji igbu mmadụ mere ọrụ na-ejupụta” n’ụwa kọmputa ndị ahụ. Magazin ọzọ kọrọ na “ndị na-akatọ egwuregwu ndị a ekwuola na ihe na-enye ha nsogbu n’obi bụ ihe ndị a na-eme n’ụwa ndị ahụ bụ́ ndị iwu megidere n’ụwa nkịtị, dị ka ụlọ ndị akwụna ebe a na-eji idina ndị akwụna n’ike eme ihe ọchị, ma ọ bụ ndị na-eji mmadụ kọmputa ndị yiri ụmụaka na-enwe mmekọahụ.”

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Ị Họrọ Ndị Dị Mma

Ndị na-egwu egwuregwu ndị ahụ a na-eme ihe ike na ha ma ọ bụ ndị na-egosi mmekọahụ n’ezoghị ihe ọ bụla nwere ike ikwu, sị: “Ọ dịghị onye na-emerụ ahụ́. Ihe ndị ahụ emeghị eme. Ọ bụ naanị egwuregwu.” Ma, ekwela ka e jiri okwu ndị dị otú ahụ rafuo gị!

Baịbụl kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” (Ilu 20:11) Ọ bụrụ na i mee ka ọ ghọọ omume gị igwu egwuregwu ndị a na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ na ha, è nwere ike ikwu na uche gị dị ọcha, ziekwa ezie? Nnyocha ndị e mere egosila ugboro ugboro na ikiri ihe ntụrụndụ ndị a na-eme ihe ike na ha na-eme ka ndị na-ekiri ha na-emekwu ihe ike ike. Akwụkwọ bụ́ New Scientist kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Otú egwuregwu vidio si eyi ihe na-eme eme na-eme ka ọ na-emetụta mmadụ karịa TV.”

Ịhọrọ igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha yiri ịhọrọ ịnọ na-ekuru anwụrụ ọkụ siga—o nwere ike ị gaghị ahụ ihe ọ na-emebi gị n’ahụ́ ozugbo, ma ọ ga-emebirịrị ihe n’ahụ́ gị. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo otú ahụ? Ikuru anwụrụ ọkụ siga mgbe niile nwere ike imebi akpa ume mmadụ ma kpatara onye ahụ ọrịa. N’otu aka ahụ, ịdị na-ekiri ebe a na-enwe mmekọahụ n’ezoghị ya ezo na ebe a na-eji obi ịta mmiri eme ihe ike nwere ike ime ‘ka mmehie gharazie ịdị na-ewute’ gị ma mee ka ọchịchọ anụ ahụ́ na-achịkwa echiche na omume gị.—Ndị Efesọs 4:19; Ndị Galeshia 6:7, 8.

Olee Egwuregwu M Kwesịrị Ịhọrọ?

Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị ekwere ka i gwuo egwuregwu kọmputa, olee otú i nwere ike isi mara nke ị ga-ahọrọ na otú oge ị ga na-eji egwu ya ga-aha? Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:

Nke m họọrọ ọ̀ ga-akpasu Jehova iwe? Ụdị egwuregwu ị họọrọ nwere ike imetụta otú Chineke si ele gị anya. Abụ Ọma 11:5 kwuru, sị: “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” Okwu Chineke kwuru banyere ndị na-eme anwansi, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diuterọnọmi 18:10-12) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị enyi Chineke, ọ dị anyị mkpa ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị n’Abụ Ọma 97:10, nke sịrị: “Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.”

Olee otú egwuregwu ahụ ga-esi metụta echiche m? Jụọ onwe gị, sị, ‘Igwu egwuregwu a ọ̀ ga-eme ka ọ dịkwuoro m mfe “ịgbara ịkwa iko ọsọ” ka ọ̀ ga-eme ka o sikwuoro m ike?’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Egwuregwu ndị na-egosi gị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ ndị ị ga-anọ na ha nụ ihe ndị dị otú ahụ agaghị enyere gị aka ịnọgide na-echebara ihe ndị ziri ezi, ihe ndị dị ọcha, na omume ọma echiche. (Ndị Filipaị 4:8) Amy, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na abụọ, kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ egwuregwu ndị nwere ike ime ka ọ gharazie inwe ihe ị ga-eji ime ihe ike, okwu rere ure, na omume rụrụ arụ kpọrọ, nke ahụ nwekwara ike ime ka ị ghara ịkpachara anya n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ gị. I kwesịrị ịkpachara nnọọ anya banyere egwuregwu ị ga-ahọrọ igwu.”

Olee otú oge m ga-eji na-egwu egwuregwu ahụ ga-aha? Deborah, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, kwuru, sị: “Echeghị m na egwuregwu kọmputa niile dị njọ. Ma ha na-eri nnọọ oge, ọ na-afọkwa nke nta ka ha rie mmadụ ahụ́.” Ọbụna egwuregwu kọmputa kasị mma nwere ike iri gị nnukwu oge. N’ihi ya, na-edekọ oge ị na-eji egwu egwuregwu, mgbe ahụzi, jiri ya tụnyere oge ndị ị na-eji eme ihe ndị ka mkpa. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Baịbụl ekwughị na ị ga-eji oge gị niile na-amụ ihe ma ọ bụ na-arụ ọrụ. O chetaara anyị niile na e nwere “oge ịchị ọchị . . . na oge ịwụli elu.” (Ekliziastis 3:4) Ọ dị mma iburu n’uche na okwu ahụ bụ́ “ịwụli elu” apụtaghị naanị igwuri egwu, kamakwa, imega ahụ́. N’ihi ya, ọ́ gaghị adị mma ka i tinye oge ụfọdụ n’imega ahụ́ kama ịdị na-anọ naanị n’ihu kọmputa?

Na-eji Amamihe Ahọrọ Egwuregwu Ndị Ị Ga-egwu

O doro anya na igwu egwuregwu kọmputa na-atọ ụtọ, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-egwu ya nke ọma. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe mere i kwesịrị iji jiri amamihe họrọ nke ị ga-egwu. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe ọmụmụ m kasị eme nke ọma na ha n’ụlọ akwụkwọ?’ Ọ́ naghị abụkarị ndị na-akasị atọ gị ụtọ? N’ezie, ọ na-abụkarị ka otu ihe ọmụmụ na-atọkwu gị ụtọ, gị ana-enwekwu mmasị na ya. Ugbu a jụọ onwe gị, sị: ‘Olee egwuregwu kọmputa kasị atọ m ụtọ? Olee ihe egwuregwu a na-akụziri m?’

Otu ihe ga-enyere gị aka bụ idetu isi ihe ndị dị n’egwuregwu nke ọ bụla ị chọrọ igwu, detuokwa isi ihe a na-achọ ịrụzu n’egwuregwu ahụ na otú a na-esi arụzu ya. Jiri ihe ndị ahụ i deturu tụnyere ụkpụrụ Baịbụl ndị e depụtara n’isiokwu a, mgbe ahụzi, kpebie ma egwuregwu ahụ ọ̀ dị mma.

Kama igwu otu egwuregwu n’ihi na ndị ọgbọ gị na-egwu ya, nwee obi ike ikpebiri onwe gị ihe ị ga-eme dabere n’ihe ị maara. Nke ka nke, gbasoo ndụmọdụ Baịbụl bụ́: “Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.”—Ndị Efesọs 5:10.

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Gịnị ka ị ga-agwa enyi gị ma ọ kpọọ gị ka gị na ya gwuo egwuregwu kọmputa a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ya?

▪ Gịnị ka ị ga-eme iji hụ na igwu egwuregwu kọmputa anaghị egbochi gị ime ihe ndị ka mkpa?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 25]

Ịhọrọ igwu egwuregwu ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha dị ka ịhọrọ ikuru anwụrụ ọkụ siga—o nwere ike ị gaghị ahụ ihe ọ na-emebi gị n’ahụ́ ozugbo, ma ọ ga-emebirịrị ihe n’ahụ́ gị

[Igbe dị na peeji nke 24]

Ugboro ole ka ị na-egwu egwuregwu kọmputa?

□ Ọ na-esi ike mụ egwuo ha

□ Otu ugboro n’izu

□ Kwa ụbọchị

Olee otú oge ị na-eji egwu ha hà?

□ Nkeji ole na ole

□ Otu awa ma ọ bụ ihe na-erughị ya

□ Ihe karịrị awa abụọ

Olee ụdị egwuregwu ndị kasị atọ gị ụtọ?

□ Iji ụgbọala agba ọsọ

□ Egwu bọl na ndị yiri ya

□ Egwuregwu ebe m na-agba égbè

□ Ụdị ọzọ

N’okpuru ebe a, dee aha otu egwuregwu kọmputa ị maara na ọ gaghị adị mma ka i gwuo.

․․․․․

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26 na 27]

IHE NDỊ NNE NA NNA KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

O nwere ike ịbụ na mgbe ị gụchara isiokwu bu nke a ụzọ, i kpebiela na egwuregwu kọmputa abụghịzi ihe ha bụ mgbe ị dị afọ iri na ụma. Dị ka nne ma ọ bụ nna, olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka ịmata ihe ize ndụ ndị nwere ike isi na ha pụta ma zere ihe ize ndụ ndị ahụ?

Ịkatọwa ndị na-emepụta egwuregwu kọmputa ma ọ bụ ikwuwe na igwu egwuregwu kọmputa bụ nnọọ ịtụfu oge agaghị enye aka. Cheta na ọ bụghị egwuregwu niile dị njọ. Otú ọ dị, ha nwere ike iri mmadụ ahụ́ ma wekọrọ oge ya. N’ihi ya, wepụta oge iji chọpụta oge nwa gị na-etinye n’egwuregwu ndị a. Tụleekwa ụdị egwuregwu ndị o yiri ka hà na-amasị nwa gị. I nwedịrị ike ịjụ nwa gị ajụjụ ndị dị ka ndị a:

Olee egwuregwu ndị ụmụ klas unu kasị egwu?

▪ Olee ihe a na-eme n’egwuregwu ahụ?

▪ Olee ihe i chere mere egwuregwu ahụ ji na-ewu ewu?

I nwere ike ịchọpụta na nwa gị maara banyere egwuregwu kọmputa karịa ka i chere! O nwedịrị ike ịbụ na o gwuola egwuregwu ndị i chere na ha adịghị mma. Ọ bụrụ na o gwuola ụdị egwuregwu ahụ, gbalịa jide onwe gị. Nke a bụ ohere i nwere ike iji nyere nwa gị aka inweta ikike nghọta.—Ndị Hibru 5:14.

Jụọ nwa gị ajụjụ ndị ga-enyere ya aka ịchọpụta ihe mere o ji agụ ya agụụ igwu egwuregwu kọmputa ndị na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ ya ajụjụ yiri nke a:

Ọ̀ na-adị gị ka ị gbara iche n’ihi na a naghị ekwe ka i gwuo egwuregwu ahụ?

Dị ka e kwuru na peeji mbụ nke isiokwu bu nke a ụzọ, ndị na-eto eto nwere ike ịdị na-egwu otu ụdị egwuregwu iji nwee ihe ha na ndị ọgbọ ha ga-eji ekwurịta okwu. Ya bụrụ na ọ bụ ya mere nwa gị ji egwu ya, o nwere ike ịbụ na ihe ị ga-eme n’ọnọdụ ahụ ga-adị iche n’ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa gị na-enwe mmasị n’egwuregwu ndị nwere ebe a na-eme oké ihe ike ma ọ bụ ebe a na-enwe mmekọahụ.—Ndị Kọlọsi 4:6.

Ya bụrụkwanụ na ihe na-adọrọ mmasị nwa gị bụ akụkụ ndị na-adịghị mma dị n’egwuregwu ọ na-egwu? Ụfọdụ ndị ntorobịa nwere ike ịdị ngwa ịgwa gị na o nwetụghị ihe ihe ike a na-eme na kọmputa na-eme ha. Ha na-asị: ‘Na m na-eme ya na kọmputa apụtaghị na m ga-eme ya na mmadụ.’ Ọ bụrụ na nwa gị chere otú ahụ, chetara ya ihe dị n’Abụ Ọma 11:5, bụ́ nke e hotara na peeji nke 26. Dị nnọọ ka amaokwu ahụ mere ka o doo anya, ọ bụghị naanị ime ihe ike na-eme ka mmadụ ghara inweta ihu ọma Chineke, ịhụ ihe ike n’anya sokwa eme ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ma a bịa ná mmekọahụ rụrụ arụ ma ọ bụ omume ndị ọzọ rụrụ arụ bụ́ ndị Okwu Chineke kagburu.—Abụ Ọma 97:10.

Ụfọdụ ndị ọkachamara tụrụ aro ndị a:

Ekwela ka e gwuo egwuregwu kọmputa n’ebe zoro ezo, dị ka n’ime ụlọ ihi ụra.

▪ Nye iwu ndị ga na-achịkwa egwuregwu (dị ka ihe atụ, onye egwula egwuregwu mgbe ọ na-emechabeghị ihe omume e kenyere ya n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ mgbe ọ na-eribeghị nri abalị ma ọ bụkwanụ mgbe ọ na-emechabeghị ihe ọzọ dị mkpa).

▪ Mee ka o doo anya na ọ bara uru igwu egwuregwu ndị ọzọ na-eme ka mmadụ megaa ahụ́.

▪ Na-ekiri ụmụ gị ka ha na-egwu egwuregwu kọmputa—ma ọ bụkwanụ, soro ha gwuo ya mgbe ụfọdụ.

O doro anya na iji duzie ụmụ gị n’ihe metụtara egwuregwu, i kwesịrị ịbụrụ ha ezi ihe nlereanya ka obi wee sie gị ike ịgwa ha okwu. Ya mere, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ụdị ihe m na-ele na TV?’ Ọ baghị uru ịghọgbuwe onwe gị—ọ bụrụ na ị bụ soro okwu ọnụ m esola omume m, ụmụ gị ga-ama!