Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara—Otu nke Gara nke Ọma

Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara—Otu nke Gara nke Ọma

Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara—Otu nke Gara nke Ọma

Mgbe e wepụtasịrị mbipụta Teta! nke January 8, 2000 nke na-ekwu banyere ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara, ndị bipụtara ya natara akwụkwọ ozi a na-agba ume.

“Mbipụta Teta! nke a chetaara m ọnọdụ mụ na di m chere ihu n’ihi nwa anyị nwanyị, bụ́ Janice. N’oge na-adịghị anya mgbe a mụsịrị ya, a chọpụtara na o nwere nsogbu ise n’obi ya, nke kasị njọ bụ ọnụnọ nnukwu akwara ndị na-ekesa ọbara nọ n’ebe ndị na-ekwesịghị ekwesị. * Ebe ọ dị mkpa ka a waa ya ahụ, anyị chọtara dọkịta na-awa ụmụaka ahụ n’obi na Buffalo, New York, U.S.A., bụ́ onye dị njikere ịwa ya ahụ n’ejighị ọbara.

“Mgbe ọ dị ọnwa anọ, a wara Janice ahụ nke mbụ—ịwa ahụ n’obi n’ebewaghị obi n’onwe ya iji gbochilatatụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara na-eruga n’akpa ume ya. Mgbe ọnwa ise gasịrị, a wara ya ahụ nke abụọ—nke ugbu a ịwa ahụ nke e bewara obi n’onwe ya nke e mere iji mee ka ọbara ya na-eruba otú o kwesịrị. A wara ya ahụ abụọ ahụ n’ejighị ọbara, ha gakwara nnọọ nke ọma!

“Janice dị afọ 17 ugbu a, ahụ sikwara ya nnọọ ike. Anyị nwere ekele maka ndị dọkịta na-awa ahụ, ndị nwere obi ike, bụ́ ndị dị njikere ịsọpụrụ echiche anyị banyere ọbara. N’ezie, ha bụ ihe unu kpọrọ ha ná mbipụta ahụ nke January 8, ‘Ndị Malitere Nkà Ọgwụ.’ N’ịza ajụjụ ahụ a jụrụ na magazin ahụ bụ́, Ịwa ahụ n’ejighị ọbara ọ̀ bụ usoro ọgwụgwọ na-adịghị ize ndụ a pụrụ iji dochie anya ọbara? anyị pụrụ iji nkweta siri ike zaa na ọ bụ n’ezie!”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’ọnọdụ a, akwara na-ebupụ ọbara n’obi na akwara na-ebubata ọbara n’obi gara nọrọ ebe ibe ha kwesịrị ịnọ. N’ihi ya, ọbara ikuku oxygen dị na ya bụ́ nke kwesịrị ịga n’ahụ na-agazi nanị n’akpa ume. A kọrọ banyere onye ihe yiri ya mere ná mbipụta anyị nke April 8, 1986 (Bekee), peeji nke 18-20.