Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Anyị Kpezie, Bụrụkwa Enyi

Ka Anyị Kpezie, Bụrụkwa Enyi

Were Ya:

  1. 1. Ezigb’iwe jurum obi.

    Ọ bụ enyim kpatara ya.

    M cheta ya, ọ n’ewutem.

    Mam g’agbalị gbaghara ya

    Ma chefuo ya.

    (UKWE)

    M g’ebili gakwuru ya

    K’anyị kpezie ma dị nám-ma.

    M g’arịọ ya k’ọ gbaghara,

    Ka mụ na ya bụrụkw’enyi.

  2. 2. M cheta na Jehova ji

    Nwa ya, Jizọs, bịa gbapụtam,

    Ọ g’eme ka m gbaghara

    Ih’ọ bụla enyịm merem

    N’ewem iwe.

    (UKWE)

    M g’ebili gakwuru ya

    K’anyị kpezie ma dị nám-ma.

    M g’arịọ ya k’ọ gbaghara,

    Ka mụ na ya bụrụkw’enyi.

    (AHỊRỊ ỌZỌ)

    M g’ebilite

    Gakwuru ya k’anyị mezie.

    M g’agbalịs’ike

    K’anyị mezie n’egbugh’oge.

  3. 3. JehovaN-na chọrọ k’anyị

    N’adị nám-ma n’oge niile.

    Obi n’erum ezigboa-la

    N’og’ọ bụla m gbaghaara

    Ma chefuo ya.

    (UKWE)

    M g’ebili gakwuru ya

    K’anyị kpezie ma dị nám-ma.

    M g’arịọ ya k’ọ gbaghara,

    Ka mụ na ya bụrụkw’enyi,

    Ka mụ na ya bụrụkw’enyi.

    Kam gbalịa mee ya.