Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

fcafotodigital/E+ via Getty Images

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmadụ Izere Ihe Ọ Bụla Si n’Anụmanụ ma Na-eri Naanị Mkpụrụ Osisi?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmadụ Izere Ihe Ọ Bụla Si n’Anụmanụ ma Na-eri Naanị Mkpụrụ Osisi?

 N’ụwa niile, ọtụtụ ndị na-agbazi mbọ izere ihe ọ bụla si n’anụmanụ, na-erizi naanị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri.

  •   Òtù a na-akpọ The Vegan Society kwuru, sị: ‘Ụfọdụ na-agbasi mbọ ike ka ha ghara imerụ ụmụ anụmanụ ahụ́. Ndị na-ebi ụdị ndụ a anaghị eri anụmanụ, ha anaghịkwa eji ihe si na ha eme uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.’

 Ihe mere ụfọdụ ji ebi ụdị ndụ a abụghị naanị na ha chọrọ ichebe ụmụ anụmanụ, kama, ha chọrọ ime ka ahụ́ sikwuo ha ike ma ọ bụ ka ha chebe gburugburu ha ma ọ bụkwanụ n’ihi okpukpe ha.

  •   Akwụkwọ Britannica Academic kwuru, sị: ‘Ibi ụdị ndụ a na mmadụ ịsọ ihe ụfọdụ abụghị otu n’ihi na ndị mmadụ na-ele ibi ụdị ndụ a anya ka ihe mmadụ kweere, ihe ndị o kpebiri ịna-eme, nakwa otú mmadụ ga-esi gbanwee ụwa ka ọ ka mma.’

 Ma, mmadụ izere ihe ọ bụla si n’anụmanụ ma na-eri naanị mkpụrụ osisi ọ̀ bụ ya ga-eme ka nsogbu ụwa bie? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Otú Onye kere anyị si ele ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ anya

 Baịbụl gosiri na Jehova Chineke, a Onye kere ihe niile, weere ya na ụmụ mmadụ ka ụmụ anụmanụ, gosikwa na o nyere ụmụ mmadụ ikike ịna-elekọta ụmụ anụmanụ. (Jenesis 1:27, 28) Chineke mechara kwe ka ụmụ mmadụ na-eri ụmụ anụmanụ. (Jenesis 9:3) Ma, ọ chọghị ka a na-ata ụmụ anụmanụ ahụhụ na nkịtị.​—Ilu 12:10.

 Baịbụl kwuru na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga na-eri anụ ma ọ bụ na ọ gaghị eri. b Ihe ọ bụla anyị kpebiri n’okwu a agaghị eme ka anyị ka ndị ọzọ bụrụ ezigbo mmadụ n’anya Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 8:8) E nweghị onye kwesịrị ịkatọ ihe onye ọzọ kpebiri iri.​—Ndị Rom 14:3.

Ihe ga-eme ka ihe dị mma n’ọdịnihu

 Baịbụl gosiri na otú anyị kpebiri isi bie ndụ agaghị eme ka nsogbu ụwa kwụsị. Ihe na-akpata ọtụtụ nsogbu n’ụwa a bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọkwá ndị mmadụ nọ na ya, na azụmahịa. Mmadụ ọ bụla agaghịkwanụ akwụsịli nosgbu ndị a. Baịbụl kwuru, sị:

 Onye kere anyị ga-eme ka nsogbu niile na-abịara anyị taa kwụsị. Baịbụl ji okwu ụfọdụ nwere ihe ha pụtara kọwaa ihe Chineke ga-eme.

  •   “Ahụkwara m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, n’ihi na eluigwe mbụ na ụwa mbụ alaala n’iyi, oké osimiri adịghịkwa.”​—Mkpughe 21:1.

 Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ, ya bụ, “eluigwe mbụ,” ma were “eluigwe ọhụrụ,” ya bụ, Alaeze ya nke ga-esi n’eluigwe na-achị, dochie ya. Alaeze ya ga-ewepụ “ụwa mbụ,” ya bụ, ndị ajọ omume ma chịwa “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ndị ji obi ha niile kweta ịna-erubere Chineke isi.

 Ọ bụ naanị n’Alaeze Chineke ka ụmụ mmadụ ga-amụta otú ha na ụmụ anụmanụ ga-esi na-ebi n’udo, na-elekotakwa ụwa nke ọma.​—Aịzaya 11:6-9.

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.

b E nyere anyị iwu na Baịbụl ka anyị “ghara iri ọbara.” (Ọrụ Ndịozi 15:28, 29) Ọ pụtara na anyị ekwesịghị ịṅụ ọbara ma ọ bụ rie anụ a na-egbupụghị ọbara. Anyị ekwesịghịkwa iri nri e tinyere ọbara.