Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ụkọ Ezigbo Mmiri n’Ụwa Niile?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ụkọ Ezigbo Mmiri n’Ụwa Niile?

 Ezigbo mmiri dị anyị niile mkpa iji dị ndụ. Ma, odeakwụkwọ Òtù Mba Ụwa bụ́ António Guterres kwuru na ‘ọ bụrụ na otú ọtụtụ ndị si achọzi mmiri achọ n’ụwa niile adịrị otú ọ dị ugbu a na-aga, mmiri ga-adị ezigbo ụkọ n’ọdịnihu.’ Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ijeri mmadụ n’ụwa niile anaghị enweta ezigbo mmiri.

Strdel/AFP via Getty Images

 Ò nwere mgbe anyị ga-emecha nweta mmiri ga-ezuru mmadụ niile? Ka mmiri ọ̀ ga na-adị ụkọ mgbe niile? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Nkwa ndị Baịbụl kwere banyere inweta mmiri

 Baịbụl kwuru na otu ụbọchị, mmiri agaghịzi adị ụkọ. N’eziokwu, kama mmiri ịdị ụkọ, ezigbo mmiri ga-eju eju.

 “Mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa. Iyi ga na-asọkwa n’ọzara. Ala kpọrọ nkụ ga-adị ka ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru. Ala mmiri na-adịghị ga-adịkwa ka isi mmiri.”​—Aịzaya 35:6, 7.

 Gịnị mere anyị ga-eji kwere ihe a Baịbụl kwuru? Legodị otu ihe Baịbụl kwuru banyere otú e si kee ụwa anyị a.

Ihe Baịbụl kwuru banyere ụwa na otú mmiri si ezo ma laghachi n’ígwé

 ‘[Chineke] ekeghị [ụwa] na nkịtị, kama o kere ya ka ndị mmadụ biri na ya.’​—Aịzaya 45:18.

 Ebe ọ bụ na Chineke kere ụwa a ka ihe ndị dị ndụ biri na ya, o kere ihe ndị ga-eme ka a na-enweta ezigbo mmiri.

 “[Chineke] na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala. Ha na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ. Ha na-esizi n’ígwé ojii zoo. Ha na-ezo, onye ọ bụla enweta mmiri.”​—Job 36:27, 28.

 Amaokwu Baịbụl ahụ kọwara otú Chineke si hazie ihe ka e nwee ike ịna-enweta ezigbo mmiri. Anwụ na-amịrị mmiri dị n’ala nakwa n’oké osimiri, mmiri ahụ na-aghọ urukpuru, mechaa zoo mee ka ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nweta ezigbo mmiri.​—Ekliziastis 1:7; Emọs 5:8.

 “M ga-eme ka mmiri na-ezoro unu n’oge kwesịrị ekwesị. Ala ga na-amị mkpụrụ ya. Osisi ndị dị n’ubi ga na-amịkwa mkpụrụ ha.”​—Levitikọs 26:4.

 Ndị Izel oge ochie bụ ndị ọrụ ubi. Chineke kwere ha nkwa na ọ ga-agọzi ha, na ọ ga na-enye ha mmiri ka ihe ha kọrọ wee na-eme nke ọma. Ọ ma na ha ga na-enwe nri ma ọ bụrụhaala na mmiri na-ezo n’oge kwesịrị ekwesị.

 N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ihe ahụ o meere ndị Izrel oge ochie n’ụwa niile. (Aịzaya 30:23) Ka ọ dị ugbu a, mmiri na-akọkwu ụkọ n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Otu n’ime ọtụtụ ihe kpatara ya bụ na mmiri anaghị ezo otú o kwesịrị. Gịnị ọzọ ka Baịbụl kwuru ga-eme ka ụkọ mmiri bie?

Otú ụkọ mmiri ga-esi bie

 Baịbụl kwuru na Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka nsogbu niile dị n’ụwa kwụsị, ma ụkọ mmiri. (Matiu 6:9, 10) Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa niile. (Daniel 2:44; Mkpughe 11:15) Alaeze Chineke ga-eme ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-enweghị ike ime. Ọ ga-ewepụ nsogbu niile na-eme ka mmiri dị ụkọ.

 Nsogbu: Oké mmiri ozuzo na oké okpomọkụ so akpata nsogbu mmiri a na-enwe taa. Ọ na-emekwa ka a na-enwe oké ọkọchị na nnukwu idei mmiri. Ihe na-akpata nnukwu idei mmiri nwere ike ịbụ n’ihi na mmiri na-ezo akwụsịghị akwụsị ma ọ bụ na oké osimiri tojuru na-asọpụtazi n’ala.

 Ihe ga-eme ka ọ kwụsị: Alaeze Chineke ga-emezi ihe niile mebiri emebi n’ụwa a, mee ka ụwa a dịghachi mma. Chineke kwere nkwa, sị: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Ezigbo mmiri ga-adị n’ala kpọrọ nkụ, mee ka ihe ndị dị ndụ ju n’ebe ihe ọ bụla na-enweghị ike ịdị ndụ ugbu a. (Aịzaya 41:17-20) Jizọs Kraịst, bụ́ eze Alaeze Chineke, ga na-elekọta ihe ndị e kere eke, dị ka ifufe na mmiri.

 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ka oké ifufe dajụọ, si otú ahụ gosi ụdị ike Chineke nyere ya. (Mak 4:39, 41) Mgbe Kraịst ga-achịwa n’Alaeze Chineke, ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịzi na-eme. Udo ga-adị ebe niile, obi eruokwa ndị mmadụ ala, e nweghị onye ga na-atụ egwu ụdị ọdachi ọ bụla.

 Nsogbu: Ndị anyaukwu na ndị na-anaghị eche banyere nsogbu ihe ha na-eme ga-akpata na-emebi mmiri, osimiri, na mmiri ndị e chekwara n’ala. Ihe a so eme ka mmiri na-akọ.

 Ihe ga-eme ka ọ kwụsị: Chineke ga-edozi ụwa, meziekwa ihe ndị e mebiri n’iyi, osimiri, oké osimiri nakwa n’ájá. Ụwa ga-abụzi paradaịs. Baịbụl kwuru, sị: “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—Aịzaya 35:1.

 Gịnị ga-eme ndị na-emebisị ụwa ma na-akpatara mmadụ ibe ha nsogbu? Chineke kwere nkwa na ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’​—Mkpughe 11:18; Ilu 2:21, 22.

 Nsogbu: Ndị mmadụ na-emebisị mmiri, mezie ka mmiri ha na-ala n’iyi karịa mmiri ụwa na-emepụta.

 Ihe ga-eme ka ọ kwụsị: Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa, ọ bụghị uche ụmụ mmadụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya. (Matiu 6:9, 10) A ga-akụziri ndị ga-ebi n’Alaeze Chineke ihe nke ọma. Aịzaya 11:9 sịrị na “amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa.” a Ihe ahụ a ga-akụziri ndị mmadụ nakwa ịhụnanya ha hụrụ Chineke na ihe ndị o kere eke ga-eme ka ha lekọta ọmarịcha ụwa anyị na ihe ndị dị na ya anya nke ọma.

  •    Iji matakwuo ihe Alaeze Chineke ga-eme, gụọ isiokwu bụ “Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?

  •    Gụọ Aịzaya isi nke 35 ka ị chọpụta otú a ga-esi eme ka ụwa ghọọ paradaịs.

  •    Leekwa vidio isiokwu ya bụ Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa? ka ị mụtakwuo ihe Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ.

a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ “Ònye Bụ Jehova?