Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Comstock Images/Stockbyte via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Olee Onye Ọchịchị Ị Ga-ahọrọ?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Olee Onye Ọchịchị Ị Ga-ahọrọ?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’izu ole na ole na-abịa, a ga-eme ntụliaka ná mba dị iche iche n’ụwa. Ndị mmadụ na-ekpebi ihe dị ha ezigbo mkpa, ya bụ, onye ha chọrọ ka ọ chịwa ha.

 Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ndị mmadụ ndị na-achị achị riri mperi

 Baịbụl kwuru otu nsogbu ndị mmadụ ndị na-achị achị nwere.

  •   “Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ. Ọ kwụsị iku ume, ọ na-alaghachi n’ájá. N’ụbọchị ahụ, ọ na-akwụsị iche echiche.”—Abụ Ọma 146:3, 4.

 Onye ọchịchị kachadị eme nke ọma ga-emechakwa nwụọ. Ihe ọzọ bụ na ha ejighị n’aka na ndị ga-anọchi ha ga-arụrụ ọrụ ọma ha malitere na-aga.—Ekliziastis 2:18, 19.

 N’eziokwu, Baịbụl gosiri na e keghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị ibe ha.

  •   ‘Mmadụ enweghị ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.’—Jeremaya 10:23.

 È nwere onye nwere ike ịbụ ezigbo onye ọchịchị taa?

Onye ọchịchị nke Chineke kwadoro

 Baịbụl kọwara na Chineke ahọpụtala onye ọchịchị kacha ruo eru, onye a ga-atụkwasịli obi. Onye ọchịchị ahụ bụ Jizọs Kraịst. (Abụ Ọma 2:6) Ọ bụ Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke. Ọchịchị a si n’eluigwe na-achị.—Matiu 6:10.

 Ị̀ ga-ahọrọ ka Jizọs na-achị gị? Baịbụl gosiri ihe mere o ji dị mma ịhọrọ ọchịchị Jizọs. Ọ sịrị:

  •   “Kwanyerenụ ọkpara ya [ya bụ, Jizọs Kraịst] ùgwù, ma ọ́ bụghị ya, Chineke ga-ewe iwe, unu ewee laa n’iyi, n’ihi na o nwere ike iwe iwe ngwa ngwa. Ndị niile na-agbaba n’ime ya na-enwe obi ụtọ.”—Abụ Ọma 2:12.

 Ọ bụ ugbu a ka ị ga-ekpebi onye ị ga-ahọrọ. Amụma Baịbụl na-egosi na Jizọs malitere ịchị n’afọ 1914 nakwa na Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya.—Daniel 2:44.

 Gụọ isiokwu bụ́ “Kpebie Ịkwado Alaeze Chineke Ugbu A” ka ị matakwuo otú ị ga-esi kwado ọchịchị Jizọs.