Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’aka ekpe: Hurricane Ian, Flọrida, USA, Septemba 2022 (Sean Rayford/Getty Images); n’etiti: Nwaanyị ya na nwa ya nwoke na-agbapụ na Donetsk, Yukren, Julaị 2022 (Alex Chan Tsz Yuk/SOPA Images/LightRocket via Getty Images); n’aka nri: Ebe a na-ele ọtụtụ ndị ahụ́ maka ọrịa koronavaịrọs, Beijing, Chaịna, Eprel 2022 (Kevin Frayer/Getty Images)

NA-ECHENỤ NCHE!

Afọ 2022 Bụ Afọ Nsogbu​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Afọ 2022 Bụ Afọ Nsogbu​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’afọ 2022, ihe ndị nta akụkọ kpụ n’ọnụ bụ akụkọ gbasara agha, ihe isi ike, na ọdachi ndị kpara obodo dị iche iche aka ọjọọ. Ọ bụ naanị Baịbụl ga-akọwali ihe ihe ndị a na-emenụ pụtara.

Ihe ihe ndị mere n’afọ 2022 pụtara

 Ihe ndị a merenụ na-emekwu ka o doo anya na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Oge a bidoro n’afọ 1914. Legodị otú ihe ndị na-emenụ si bụrụ ihe Baịbụl buru amụma na ha ga-eme n’oge a:

 “Agha.”​—Matiu 24:6.

  •   “Afọ 2022 Bụ Afọ Ọzọ Agha Kpara Yurop Aka Ọjọọ.” a

 Gụọ isiokwu bụ́ “Rọshịa Amalitela Ịlụso Yukren Agha.”

 “Ụkọ nri.”​—Matiu 24:7.

  •   “Afọ 2022 Bụ Afọ Agụụ Nyụrụ Ndị Mmadụ Ịkpakwụ Otú A Na-atụghị Anya Ya.” b

 “Ọrịa na-efe efe.”​—Luk 21:11.

  •   “Ọrịa polio bịaghachiri, ọrịa a na-akpọ monkeypox ana-emesi ndị mmadụ ike, ọrịa koronavaịrọs ana-akpakwa mkpamkpa. Ihe a gosiri otú ọrịa na-efe efe jọruru ná njọ nakwa na e nweghị ezigbo ihe ndị mmadụ ga-emeli iji gbochie ha. c

 “Ihe ndị na-atụ egwu.”​—Luk 21:11.

  •   “Oké okpomọkụ, ụkọ mmiri ozuzo, ọkụ ọgbụgba, na idei mmiri. A gaghị echefu ụdị ọkọchị na okpomọkụ e nwere n’afọ 2022 echefu n’ihi otú o si kpaa ndị mmadụ aka ọjọọ. O gburu ọtụtụ puku mmadụ, meekwa ka ọtụtụ nde mmadụ bi n’ebe dị iche iche n’ụwa gbara aka ụlọ.” d

 Gụọ isiokwu bụ́ “Oké Okpomọkụ A Na-enwe n’Ụwa Niile.”

 “Ọgba aghara.”​—Luk 21:9.

  •   “Otú ndị mmadụ si na-ewe iwe maka otú ihe si sie ike n’obodo ha dị iche iche, karịchaa otú ọnụ ahịa ihe dị iche iche si rịa elu ọjị, mere ka ha mee ọtụtụ ngagharị iwe n’afọ 2022 gbasara ndị ọchịchị.” e

 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Niile Dịzi Oké Ọnụ n’Ụwa Niile.”

Gịnị ga-eme n’afọ ọzọ?

 E nweghị onye ga-ekwuli hoo haa ihe ga-eme n’afọ 2023. Ihe anyị ma bụ na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke, ma ọ bụ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-abịa gbanwee ọtụtụ ihe n’ụwa a. (Daniel 2:44) Ọchịchị ahụ ga-ewepụ ihe niile na-akpatara ndị mmadụ nsogbu n’ụwa a, meekwa ka e mee uche Chineke n’ụwa.​—Matiu 6:​9, 10.

 Anyị na-agba gị ume ka ị na-eme ihe Jizọs Kraịst gwara anyị ka anyị na-eme, ya bụ, ‘ịna-eche nche,’ ka anyị nwee ike ịna-ahụ otú ihe ndị na-eme n’ụwa si emezu amụma Baịbụl. (Mak 13:37) Biko, kpọtụrụ anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl ka ị hụ otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka ugbu a nakwa otú ọ ga-esi mee ka gị na ndị ezinụlọ gị nwee olileanya maka ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu.

a AP News, “2022 Was Year the Horror of War Returned to Europe,” by Jill Lawless, December 8, 2022.

b World Food Programme, “A Global Food Crises.”

c JAMA Health Forum, “Living in an Age of Pandemics​—From COVID-19 to Monkeypox, Polio, and Disease X,” by Lawrence O. Gostin, JD, September 22, 2022.

d Earth.Org, “What’s Behind the Record-Breaking Extreme Weather Events of Summer 2022?” by Martina Igini, October 24, 2022.

e Carnegie Endowment for International Peace, “Economic Anger Dominated Global Protests in 2022,” by Thomas Carothers and Benjamin Feldman, December 8, 2022.