Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI EGO I NYERE N’ONYINYE EME

Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ọbụ Aka Gị

Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ọbụ Aka Gị

SEPTEMBA 1, 2021

 N’Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2020​—Agba nke 6, Nwanna Geoffrey Jackson kwuru, sị: “N’afọ ole na ole gara aga, ònye gaara ekweta na anyị ga-esi n’Ịntanet na-enweta nri ime mmụọ?” Ọ̀ kwa ị ga-asị na enweghị onye gaara ekweta? Nwanna Geoffrey Jackson sịziri: “Ma ugbu a, anyị nwere ike ịna-ajụ sị, ‘Gịnị ka anyị gaara eme ma a sị na anyị enweghị ngwá ọrụ dị ka JW Library?’ Ọ pụtara na Jehova na-akwadebe anyị kemgbe ọtụtụ afọ ka anyị jikere maka ụdị oge a.”

 Olee otú Jehova si na-akwadebe anyị? Olee ọrụ ndị a rụrụ iji mepụta JW Library? Gịnị ka a na-emekwa iji hụ na ọ na-arụ ọrụ, ma na-akakwu mma?

E Nwetụbeghị Ụdị Ya

 N’ọnwa Mee afọ 2013, Òtù Na-achị Isi gwara ngalaba dị n’isi ụlọ ọrụ anyị a na-akpọ MEPS Programming, ka ha mepụta akụrụ ngwá (app) a na-etinye n’Ịntanet nke ga-enwe Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke e dezigharịrị edezigharị. Nwanna Paul Willies, onye na-arụ ná ngalaba MEPS Programming, kwuru, sị: “Tupu oge ahụ, anyị etinyetụbeghị akụrụ ngwá ọ bụla n’ebe ọhanaeze si ewere akụrụ ngwá n’Ịntanet (app stores). Ma, anyị kpọkọtara ụfọdụ ụmụnna, kwụsị ọrụ ụfọdụ anyị ji n’aka, anyị na ngalaba ndị ọzọ agbakọọ aka hazie otú akụrụ ngwá ahụ ga-adị na ihe ndị ga-adị n’ime ya. Anyị kpere ekpere ọtụtụ ugboro. Jehova nyeere anyị aka anyị ewepụta akụrụ ngwá ahụ ná nnọkọ a na-enwe kwa afọ. Ihe o were anyị ịru ya bụ naanị ọnwa ise.”

 Ihe ọzọ anyị mere bụ ime ka akụrụ ngwá ahụ bụrụ ezigbo ọ́bá akwụkwọ ga-enwe ọtụtụ akwụkwọ ndị ga-adịkwa n’ọtụtụ asụsụ. N’ọnwa Jenụwarị afọ 2015, ọtụtụ akwụkwọ anyị ndị ọhụrụ ndị dị n’asụsụ Bekee adịla n’akụrụ ngwá ahụ. Mgbe ọ na-eru n’ọnwa Julaị, ndị mmadụ nweziri ike ịga n’Ịntanet were akwụkwọ ndị ahụ n’asụsụ dị iche iche.

 Kemgbe ahụ, ụmụnna anyị emeela ka akụrụ ngwá a kakwuo mma. Ha etinyela ya vidio dị iche iche, tinye akwụkwọ na vidio ndị anyị ji amụ ihe n’ọmụmụ ihe n’otu ebe, tinyekwa ihe ga-abụ a pịa ya aka n’amaokwu Baịbụl o bupụta ihe dị n’Akwụkwọ Nchọnchọ.

A Na-eme Ka Ọ́bá Akwụkwọ A Na-akakwu Mma

 Kwa ụbọchị, a na-emeghe JW Library n’ekwentị nakwa n’ihe ndị yiri ya dị nde asatọ. A na-emeghekwa ya n’ekwentị nakwa n’ihe ndị yiri ya karịrị nde iri na ise kwa ọnwa. Gịnị ka a na-eme ka akụrụ ngwá a nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma n’ekwentị ndị a niile? Nwanna Willies kwuru, sị: “E nweghị akụrụ ngwá a na-anaghị arụnye ihe na ya ka oge na-aga. Anyị na-etinye ihe ọhụrụ na ya, na-emekwa ka ọ dịkwuoro ndị mmadụ mfe. Anyị na-emezikwa ihe n’akụrụ ngwá a ka o nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma maka na ihe ọgbara ọhụru ndị na-eme ka Ịntanet na-arụ arụ nke ọma na-apụta ka oge na-aga. Anyị na-arụzikwa ihe ndị dị n’ime JW Library ndị na-eme ka ọ na-arụ ọrụ nke ọma n’ihi akwụkwọ anyị na vidio ndị ọhụrụ a na-etinye na ya.” Ka ọ dị ugbu a, akwụkwọ dị na JW Library dị narị puku abụọ (200,000) n’asụsụ dị iche iche, vidio na ihe ndị a na-egere egere adị ihe karịrị narị puku isii (600,000).

 Ọ bụghị naanị kọmputa ka e ji arụ ihe ndị a na JW Library. E nwere ihe ndị ọzọ a na-akwụ ụgwọ ha e ji arụ ya. Ihe a na-akwụ kwa afọ maka naanị otu n’ime ihe ndị ahụ bụ otu puku dọla na nari ise ($1,500) [ya bụ, ihe dị ka narị puku naịra isii na iri puku abụọ na abụọ, narị asatọ na iri asaa na ise (₦622,875)]. Ihe ọzọ bụkwa na kwa afọ, ngalaba MEPS Programming na-eji ihe dị ka iri puku dọla ($10,000) [ya bụ, ihe dị ka nde naịra anọ na otu narị puku, na puku iri ise na abụọ na narị ise (₦4,152,500)] azụ ihe dị iche iche n’aka ndị na-emepụta ekwentị na ihe ndị yiri ya ka ha nwee ike ime ka JW Library na-arụ ọrụ nke ọma na kọmputa, ekwentị na ihe ndị yiri ya.

Ihe Ndị A Na-ewere n’Ịntanet Mere Ka Anyị Na-echekwa Ego

 Ego anyị na-emefu iji bie akwụkwọ, kwee ha, ma buga ha ebe dị iche iche ebelatala n’ihi na anyị nweziri JW Library. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị nke afọ 2013 anyị biri fọrọ obere ka o ruo nde iri na abụọ. Ma, nke anyị biri maka afọ 2020 dị naanị ihe dị ka nde ise n’agbanyeghị na ihe dị ka narị puku mmadụ asaa batakwuru n’ọgbakọ n’ụwa niile. Gịnị mere e ji bie naanị ole ahụ? Ọ bụ maka na ọtụtụ ụmụnna anyị na-ejizi JW Library agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. a

“E Nweghị Ihe Dị Ka Ya”

 JW Library bara ọtụtụ uru. Nwanna nwanyị Geneviève onye Kanada kwuru na JW Library emeela ka ya na-amụchi ihe anya. Ọ sịrị: “Echeghị m na m ga na-amụli ihe ụtụtụ ọ bụla ma ọ bụrụ na ọ bụ m chọọ ịmụ ihe mụ agaa kpopụtawa akwụkwọ dị iche iche. Ma, ihe m na-emezi bụ naanị iwere tablet m. Ihe niile m chọrọ dị na ya. Otú a m si amụchizi ihe anya emeela ka okwukwe m sie ike, meekwa ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.”

Geneviève

 JW Library nyekwaara ọtụtụ ndị aka n’oge ọrịa koronavaịrọs siri ike. Charlyn, onye Amerịka kwuru, sị: “Mgbe ọrịa koronavaịrọs na-akpa ụwa niile aka, enwetaghị m akwụkwọ anyị e biri ebi ndị ewepụtara ọhụrụ n’ime ihe karịrị otu afọ. Ma, ha dị na JW Library. Ha mekwara ka okwukwe anyị sie ike. M na-ekele Jehova maka akụrụ ngwá a.”

 Faye, onye Filipinz, kwuru ihe dị ọtụtụ ndị n’obi. Ọ sịrị: “Otu akụrụ ngwá a emeela ka mụ na Jehova dikwuo ná mma. Ọ bụ ya bụ ihe mbụ m na-emepe gụọ n’ụtụtụ. Ọ bụ ihe dị na ya ka m na-ege mgbe m na-arụ ọrụ n’ụlọ. Ọ bụ ya ka m ji akwadebe ọmụmụ ihe. Ọ bụ ya ka m ji akwadebe ihe mụ na mmadụ ga-amụ n’ozi ọma. M na-ele vidio ndị dị na ya mgbe m na-ezu ike. M na-agụ isiokwu ndị dị na ya ma ọ bụ gụọ Baịbụl mgbe m na-eche mmadụ. E nweghị ihe dị ka ya.”

 JW Library na-abakwa ezigbo uru n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna nwaanyị onye Kameruun nọ n’ozi ọma, ọ chọrọ ịgụrụ mmadụ amaokwu Baịbụl nwanna nwaanyị ọzọ gụụrụ mmadụ n’ozi ọma izu ole na ole gara aga. Ma, o chetaghịzi amaokwu Baịbụl ahụ. Nwanna nwaanyị ahụ sịziri: “Ọ dabara na m chetara otu okwu dị n’amaokwu ahụ. M meghere JW Library, gaa na Baịbụl, chọzie okwu ahụ. Ozugbo ahụ, m hụrụ amaokwu ahụ. JW Library enyerela m aka ịchọta ọtụtụ amaokwu Baịbụl ndị m na-echefu oge ụfọdụ.”

 Ọ bụ onyinye unu ji obi unu niile enye na donate.isa4310.com mere ka anyị nwee ike imepụta JW Library, na-emezi ya, ma na-eme ka ọ kakwuo mma maka ụmụnna anyị n’ụwa niile. Unu emeela maka onyinye ndị unu na-enye.

Ihe Dị Iche Iche A Rụrụ na JW Library Ka Oge Na-aga

  1. Ọktoba 2013​—E wepụtara JW Library nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dị na ya

  2. Jenụwarị 2015​—E tinyere akwụkwọ ndị ọzọ n’asụsụ Bekee, mechaa tinye ha n’ọtụtụ asụsụ

  3. Nọvemba 2015​—E tinyere ya ụcha dị iche iche e ji eteji ihe

  4. Mee 2016​—E tinyere ebe e tinyere ihe niile maka ọmụmụ ihe

  5. Mee 2017​—E tinyere ebe e nwere ike idenye ihe

  6. Disemba 2017​—E tinyere Baịbụl nke Nwere Ihe E Ji Amụ Ihe

  7. Mach 2019​—E mere ya otú a ga-enwe ike ịna-esi na ya ewere ihe a na-egere egere, ịnọ na ya lee vidio, nakwa inweta ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nchọnchọ

  8. Jenụwarị 2021​—E tinyere ihe ndị dị n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

a Ihe ọ bụla mmadụ si na JW Library were na-efu obere ego. Dị ka ihe atụ, n’afọ gara aga, anyị mefuru ihe karịrị otu nde dọla na narị puku ise ($1.5 million) [ya bụ, ihe dị ka narị nde naịra isii na iri nde abụọ na anọ, na narị puku abụọ na iri puku asaa (₦624,270,000)] iji mee ka ndị mmadụ nwee ike iwere ihe na jw.org nakwa JW Library, nakwa ka ha nọrọ ebe ndị ahụ lee vidio. Ma, ego ahụ ebughị ibu ma e jiri ya tụnyere ego ole a gaara eji bie akwụkwọ, mepụta CD na DVD, ma buga ha ebe dị iche iche.