Ozi Ọma Matiu Dere 12:1-50

  • Jizọs bụ “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike” (1-8)

  • Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ (9-14)

  • Ohu Chineke hụrụ n’anya (15-21)

  • Jizọs ji mmụọ nsọ chụpụ ndị mmụọ ọjọọ (22-30)

  • Mmehie nke a na-agaghị agbaghara (31, 32)

  • A na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla (33-37)

  • Ọrụ ebube a rụụrụ Jona (38-42)

  • Mgbe mmụọ ọjọọ lọghachiri ebe o si pụọ (43-45)

  • Nne na ụmụnne Jizọs (46-50)

12  N’oge ahụ, Jizọs si n’ubi ọka wit na-agafe n’Ụbọchị Izu Ike. Agụụ gụwara ndị na-eso ụzọ ya. Ha wee malite ịghọrọ ụyọkọ ọka wit na-ata.+  Mgbe ndị Farisii hụrụ ihe a, ha sịrị ya: “Ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe iwu kwuru ka a ghara ime n’Ụbọchị Izu Ike.”+  O wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?+  Ọ banyere n’ụlọ Chineke, were achịcha a na-enye Chineke,+ ya na ndị so ya ataa. Ma, iwu kwuru na o nweghị onye kwesịrị ịta ya ma e wezụga ndị nchụàjà.+  Ka ọ̀ bụ na unu agụbeghị n’Iwu ahụ* na ndị nchụàjà nọ n’ụlọ nsọ na-arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, ma a naghị asị na ha dara iwu?+  Ma ana m asị unu na onye ka ụlọ nsọ ahụ nọ ebe a.+  Ma, a sị na unu ghọtara ihe okwu a pụtara, ‘Achọrọ m ebere,+ ọ bụghị àjà,’+ unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.  N’ihi na Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izu Ike.”+  Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ nzukọ ha. 10  Ma, e nwere otu nwoke otu aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.+ Ụfọdụ ndị wee jụọ Jizọs ajụjụ iji nweta ebubo ha ga-ebo ya.+ Ha jụrụ ya, sị, “È kwesịrị ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike?” 11  O wee sị ha: “Ọ bụrụ na otu onye n’ime unu nwere otu atụrụ, atụrụ ahụ adaba n’olulu n’Ụbọchị Izu Ike, ọ́ gaghị aga dọpụta ya?+ 12  O doro anya na mmadụ bara uru karịa atụrụ. N’ihi ya, iwu kwuru ka a na-eme ihe dị mma n’Ụbọchị Izu Ike.” 13  Ọ gwaziri nwoke ahụ, sị: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa ya, ya adị mma ka aka nke ọzọ. 14  Ma ndị Farisii pụrụ wee gbaa izu otú ha ga-esi gbuo ya. 15  Ebe Jizọs ma nke a, o si ebe ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị sokwaara ya,+ o wee gwọọ ndị niile ahụ́ na-adịghị. 16  Ma, ọ gwasiri ha ike ka ha ghara ime ka a mata onye ọ bụ,+ 17  ka ihe e si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo wee mezuo. Ọ sịrị: 18  “Leenụ ohu m+ nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.*+ M ga-enye ya mmụọ m,+ ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi doo mba niile anya. 19  Ọ gaghị ese okwu.+ Ọ gaghị etisi mkpu ike, e nweghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. 20  Ọ gaghị azọgbu ahịhịa amị fọrọ obere ka ọ kpọnwụọ, ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka* ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ,+ ruo mgbe o mere ka e kpee ikpe ziri ezi. 21  N’eziokwu, mba niile ga-enwe olileanya n’aha ya.”+ 22  Ha wee kpọtara ya nwoke mmụọ ọjọọ ji, onye kpuru ìsì ma daa ogbi, o wee gwọọ ya, nwoke ogbi ahụ amalite ikwu okwu na ịhụ ụzọ. 23  Ihe a juru ìgwè mmadụ ahụ anya, ha amalite ịsị: “Ọ̀ bụ na onye a abụghị Nwa Devid?” 24  Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe a, ha sịrị: “Ọ bụ ike Bielzebọb,* onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ, ka onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 25  Ebe ọ ma ihe ha na-eche n’echiche, ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada. Obodo ọ bụla ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị adịgide. 26  Ọ bụrụkwa na Setan achụpụ Setan, o kewaala na-emegide onwe ya. Oleezi otú alaeze ya ga-esi kwụrụ? 27  Ọ bụrụkwa na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ọ bụ ya mere ha ga-eji bụrụ ndị ga-ekpe unu ikpe. 28  Ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’eziokwu, Alaeze Chineke akwaala unu.+ 29  Ma ọ bụ, olee otú mmadụ ọ bụla ga-esi banye n’ụlọ nwoke dị ike ma buru ngwongwo ya, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ? Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike ibukọrọ ihe ndị dị n’ụlọ ya. 30  Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m. Onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.+ 31  “Ọ bụ ya mere m ji asị unu na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ ụdị mmehie na nkwulu ọ bụla, ma a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.+ 32  Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla nke kwuluru Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya.+ Ma, onye ọ bụla nke kwuluru mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya, ma n’oge a* ma n’ọdịnihu.+ 33  “Ọ bụrụ na unu elezie osisi anya, ọ ga-amị mkpụrụ dị mma. Ma, ọ bụrụ na unu elezighị osisi anya, mkpụrụ ya agaghị adị mma. A na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla.+ 34  Ụmụ ajụala,+ olee otú unu ga-esi kwuo ihe dị mma, ebe unu bụ ndị ajọ omume? N’ihi na ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+ 35  Ezigbo mmadụ na-esi n’ezigbo akụ̀ ya ewepụta ihe ọma, ma, ajọ mmadụ na-esi n’akụ̀ ọjọọ ya ewepụta ihe ọjọọ.+ 36  Ana m asị unu na ụmụ mmadụ ga-aza ajụjụ+ n’Ụbọchị Ikpe banyere okwu ọ bụla na-abaghị uru ha kwuru. 37  N’ihi na a ga-eji ihe i kwuru kpọọ gị onye ezi omume, a ga-ejikwa ihe i kwuru ma gị ikpe.” 38  Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe àmà.”+ 39  Ọ sịrị ha: “Ọgbọ ọjọọ nke hapụrụ Chineke* na-achọ ihe àmà, ma o nweghị ihe àmà a ga-egosi ya ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona onye amụma.+ 40  N’ihi na otú ahụ Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ụbọchị atọ, ehihie na abalị,+ ka Nwa nke mmadụ ga-anọkwa n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.+ 41  Ndị Ninive na ọgbọ a ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe. Ndị Ninive ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ ihe Jona kwusara.+ Ma, onye ka Jona nọ ebe a.+ 42  A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda na ọgbọ a n’Ụbọchị Ikpe. Ọ ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ okwu onye amamihe Solomọn na-ekwu.+ Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.+ 43  “Mgbe mmụọ ọjọọ* si n’ime mmadụ pụọ, ọ na-aga ebe mmiri na-adịghị ka ọ chọta ebe ọ ga-ezu ike, o nweghịkwa ebe ọ na-achọta.+ 44  Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụọ.’ Ọ bịarutekwa, ọ na-ahụ na ụlọ ahụ tọgbọ nkịtị, na a zachara ya nke ọma, chọọkwa ya mma. 45  Ọ na-agazi kpọrọ mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya. Mgbe ha banyere, ha na-ebirikwa ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-akazi nke mbụ njọ.+ Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ọgbọ ọjọọ a.” 46  Mgbe ọ ka nọ na-agwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ bịara. Ha guzo n’èzí na-achọ ịgwa ya okwu.+ 47  N’ihi ya, otu onye sịrị ya: “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo n’èzí. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” 48  Ọ sịrị onye ahụ gwara ya ihe a: “Ònye bụ nne m, ole ndị bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?” 49  Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka ma sị: “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke.+ 50  N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme uche Nna m nke bi n’eluigwe, onye ahụ bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “nke na-akwa iko.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”