Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 2

Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?

Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?

Noa

Ebreham na Sera

Mozis

Jizọs Kraịst

Ọtụtụ ndị na-eche na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ okpukpe ọhụrụ. Ma, kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ na narị asaa gara aga, Chineke kpọrọ ndị na-efe ya “ndị àmà” ya. (Aịzaya 43:​10-12) Tupu afọ 1931, ihe a na-akpọ anyị bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Gịnịzi mere anyị ji malite ịza Ndịàmà Jehova?

E ji ya mara Chi anyị na-efe. N’Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie, aha Chineke bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro puku asaa. N’ọtụtụ Baịbụl ndị e nwere taa, e jirila utu aha ndị dị ka Onyenwe Anyị ma ọ bụ Chineke dochie ya. Ma, mgbe Chineke gwara Mozis na aha ya bụ Jehova, ọ sịrị ya: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọpụpụ 3:15) O ji nke a gosi na ya dị iche na chi ụgha niile ndị mmadụ na-efe. Obi dị anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova.

E ji ya ama ọrụ anyị na-arụ. Ọtụtụ ndị fere Chineke n’oge ochie gbaara ndị ọzọ àmà gbasara okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ. Onye mbụ n’ime ha bụ Ebel, onye ezi omume. Ka oge na-aga, Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Devid na ndị ọzọ bịara soro ná ndị Baịbụl kpọrọ “oké ìgwè ndị àmà.” (Ndị Hibru 11:4–12:⁠1) Anyị kpebisiri ike na anyị ga na-eme ka ndị mmadụ mara nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke anyị otú ahụ mmadụ nwere ike kpebie na ya ga-aga n’ụlọikpe gbaara onye aka ya dị ọcha akaebe.

O gosiri na anyị na-eme ka Jizọs. Baịbụl kwuru na Jizọs bụ “ezi onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mkpughe 3:14) Jizọs ji ọnụ ya kwuo na ya mere ‘ka a mara aha Chineke’ nakwa na ya ‘gbaara eziokwu gbasara Chineke àmà.’ (Jọn 17:26; 18:37) N’ihi ya, ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-abụrịrị ndị a kpọkwasịrị aha Jehova. Ha kwesịkwara ime ka ndị ọzọ mara aha ahụ. Ọ bụ ya ka Ndịàmà Jehova na-agba mbọ na-eme.

  • Gịnị mere Ndị Mmụta Baịbụl ji zawa Ndịàmà Jehova?

  • Olee mgbe Jehova bidoro inwe ndị àmà n’ụwa?

  • Olee Onyeàmà kacha ndị àmà niile Jehova nwerela?