Gaa n'Isiokwu

È KERE YA EKE?

Ihe Eju Mmiri A Na-akpọ Barnacle Ji Arapara n’Ihe

Ihe Eju Mmiri A Na-akpọ Barnacle Ji Arapara n’Ihe

 Ọ dịla anya ndị ọkà mmụta sayensị na-ahụ maka ụmụ anụmanụ chọpụtara ikike eju mmiri a na-akpọ barnacle nwere ịrapara na nkume, n’àkwà mmiri, nakwa n’okpuru ụgbọ mmiri. Ndị ọkachamara kwuru na o nweghị ihe mmadụ mepụtarala e ji anyagide ihe a ga-eji tụnyere nke na-esi n’ahụ́ eju mmiri a na-akpọ barnacle apụta. Ma, ọ dịbeghị anya otú eju mmiri ahụ si arapara n’ihe dị mmiri mmiri kwụsịrị ịgba ndị mmadụ gharịị.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Nchọpụta e mere gosiri na obere barnacle malitere igwu mmiri ọhụrụ na-ebu ụzọ ele ihe dị iche iche tupu ya ahọrọ nke ọ ga-arapara na ya. Ọ họrọ ebe ọ ga-arapara na ya, ọ na-agbụsa ihe abụọ n’ihe ahụ. Nke mbụ ọ na-agbụsa na-adị mmanụ mmanụ, ọ bụ ya na-ewepụ mmịrị dị n’ebe ahụ ọ chọrọ ịnyagide. Ọ ga-emezi ka barnacle a nwee ike ịgbụsa ihe nke abụọ ọ ga-eji arapara n’ihe.

 Ihe abụọ ndị a na-aghọ mgbá siri ezigbo ike, nke nje na-enweghị ike ịkpa aka. Otú a mgbá a si esi ezigbo ike na-abara barnacle uru n’ihi na ọ ga-arapara n’ihe ahụ n’oge niile ọ dị ndụ.

Eju mmiri a na-akpọ barnacle na mgbá ya

 Otú a barnacle si emepụta mgbá o ji arapara n’ihe dị mgbagwoju anya karịa otú ndị sayensị cheburu. Otu onye so ná ndị chọpụtara otú a barnacle si emepụta mgbá ndị o ji arapara n’ihe kwuru, sị: “Ihe a bụ ụzọ magburu onwe ya anyị ga-esi emepụta ihe ndị ọ ga-abụ e tee ha n’ihe, mmiri agaghị emebi ihe ndị ahụ.” Nchọpụta a e mere nwekwara ike inyere ndị sayensi aka imepụta mgbá ndị a ga na-ete n’ihe ndị a na-eli n’ime mmiri, ná ngwá eletrọnik ma ọ bụkwanụ ihe ndị dọkịta ji arụ ọrụ.

 Gịnị ka i chere? Ihe eju mmiri a na-akpọ barnacle ji arapara n’ihe, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka è kere ya eke?