Gaa n'Isiokwu

Vidio Ndị E Ji Akụzi Baịbụl

Vidio ndị a kọwara ihe ndị Baịbụl zara gbasara ọtụtụ ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ndị mmadụ na-ajụ. Ha na-akọwa ihe ụfọdụ dị n’isiokwu ndị dị na broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

È Kere Eluigwe na Ụwa Eke?

Ndị mmadụ na-aghọtahiekarị ihe Baịbụl kwuru gbasara otú e si kee ihe. Ụfọdụ na-eweredị ya ka akụkọ ifo. Ànyị kwesịrị ikwere n’ihe Baịbụl kwuru?

Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?

Chọpụta ihe ndị gosiri na mmadụ ikwere na Chineke dị abụghị ikwere n’ihe na-enweghị isi.

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.

Mmadụ na Chineke Hà Ga-abụli Enyi?

Kemgbe ụwa, ọ na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike ịmata Onye kere ha. Baịbụl ga-enyere anyị aka ịbụ enyi Chineke. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmatagodị aha Chineke.

Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl?

Ebe ọ bụ ụmụ mmadụ dere Baịbụl, è kwesịrị ịna-akpọ ya Okwu Chineke? Uche ònye ka e dere na Baịbụl?

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Eziokwu?

Ọ bụrụ na Baịbụl bụ okwu Chineke, ọ ga-adị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ e detụrụla.

Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa?

Ụwa anyị a mara ezigbo mma. Chineke mere ka ọ dịrị ebe kwesịrị ekwesị, ka ọ ghara ịdị ezigbo nso ma ọ bụ ezigbo anya n’anyanwụ. Gịnị mere o ji kee ụwa otú a?

Gịnị Mere E Ji Kee Anyị?

Mụta ihe ị ga-eme ka ị na-enwe ezigbo obi ụtọ, ndụ gị enweekwa isi.

Gịnị Na-eme Ndị Mmadụ ma Ha Nwụọ?

Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe a ga-akpọlite ọtụtụ ndị n’ọnwụ otú ahụ a kpọlitere Lazarọs.

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Na-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ n’Ọkụ Ala Mmụọ?

Ebe ọ bụ na Baịbụl sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya,” o mekataghị taa ndị mmadụ ahụhụ maka ihe ọjọọ ha mere n’oge gara aga.

Jizọs Kraịst Ọ̀ Bụ Chineke?

Jizọs Kraịst ọ̀ bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile? Ka hà dị iche n’ibe ha?

Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

Baịbụl gosiri na ọnwụ Jizọs bara ezigbo uru. È nwere uru ọnwụ ya bara?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziri gbasara Alaeze Chineke karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ekpe ekpere kemgbe ka Alaeze ahụ bịa.

Alaeze Chineke Malitere Ịchị n’Afọ 1914

Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị isii, Chineke mere ka otu nnukwu eze rọọ nrọ nke na-emezu n’oge a.

Ụwa Agbanweela Kemgbe Afọ 1914

Ihe ndị na-eme n’ụwa nakwa àgwà ndị mmadụ na-akpa kemgbe afọ 1914 na-egosi na amụma Baịbụl buru gbasara ‘oge ikpeazụ’ na-emezu.

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ọdachị Ndị Na-emere Onwe Ha?

Mmadụ abụọ ọdachi ndị na-emere onwe ha kpataara nsogbu kwuru ihe ha mụtara na Baịbụl.

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?

Ọtụtụ ndị na-ajụ ihe mere ọtụtụ ndị ji kpọọ ibe ha asị, ọtụtụ ndị ana-atakwa ahụhụ. Otú Baịbụl si zaa ajụjụ a doro anya, na-akasikwa mmadụ obi.

Chineke Ọ̀ Na-anabata Otú Ọ Bụla Ndị Mmadụ Si Efe Ya?

Ọtụtụ ndị kweere na o nweghị ihe okpukpe ọ bụla ị na-ekpe mere.

Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka E Jiri Ihe A Kpụrụ Akpụ ma Ọ Bụ Foto Na-efe Ya?

Ihe a kpụrụ akpụ, ò nwere ike ime ka anyị bịaruo Chineke anyị na-enweghị ike ịhụ anya nso?

Chineke Ọ̀ Na-aza Ekpere Niile?

Chineke anaghị anabata ekpere mmadụ kpere nke gosiri na onye ahụ na-eche naanị gbasara onwe ya. Ọ naghịkwa aza ekpere nwoke na-echi nwunye ya ọnụ n’ala.

Olee Otú Chineke Si Ele Alụmdi na Nwunye Anya?

Chineke chọrọ ka ndị lụrụ di na nwunye na-enwe obi ụtọ. Ndụmọdụ dị na Baịbụl enyerela ọtụtụ ndị di na nwunye aka.

Ile Ndị Gba Ọtọ Ọ̀ Bụ Mmehie n’Anya Chineke?

Okwu bụ́ “ile ndị gba ọtọ” ọ̀ dị na Baịbụl? Olee otú anyị ga-esi mara otú Chineke si were mmadụ ile ndị gba ọtọ?