Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Udo Adịbeghị n’Ụwa?

Gịnị Mere Udo Adịbeghị n’Ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mbọ niile ụmụ mmadụ gbarala iji mee ka udo dịrị n’ụwa enwebeghị isi. Ndị nke ha ka ga-agba n’ọdịnihu agaghịkwa enwe isi. Lee ihe kpatara ya:

  •   Jeremaya 10:23 kwuru, sị: “Ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-eso.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. N’ihi ya, ha emekataghị mee ka udo dịrị n’ụwa.

  •   Abụ Ọma 146:3, 4 sịrị: “Atụkwasala obi gị na ndị ọchịchị, ma ọ bụkwa na mmadụ nkịtị, onye na-enweghị ike ịzọpụta gị. Mgbe o kubiri ume ka ọ na-alaghachi n’aja, atụmaatụ ya niile ga-ala n’iyi n’ụbọchị ahụ.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ndị ọchịchị agaghị emeli ka agha kwụsị, otú ọ sọkwara ha gbaa ná mbọ.

  •   2 Timoti 3:1–4 kwuru, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” Anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ Àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa n’oge a agaghị ekwe ka e nwee udo n’ụwa.

  •   Mkpughe 12:12 sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” Ekwensu bụ onye iro Chineke. Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na a chụdatara ya n’ụwa. Ọ bụ yanwa mere ụmụ mmadụ ji akpa arụ dị iche iche juru n’ụwa anyị a. Ebe ọ bụ yanwa na-achị ụwa ọjọọ a, udo emekataghị dịrị na ya.—Jọn 12:31.

  •   Daniel 2:44 kwuru, sị: “[Alaeze Chineke] ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” Mmadụ niile chọrọ ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ma o nweghị ọchịchị mmadụ ọ bụla ga-emeli ya. Naanị Alaeze Chineke ga-emeli ya.—Abụ Ọma 145:16.