Gaa n'Isiokwu

M̀ Kwesịrị Ikpegara Ndị Sent Ekpere?

M̀ Kwesịrị Ikpegara Ndị Sent Ekpere?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba. Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị Chineke ka anyị ga na-ekpegara ekpere n’aha Jizọs. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kpeenụ ekpere otú a: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) O nwetụghị mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpegara ndị sent, ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ekpere, ma e wezụga Chineke.

 Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke họpụtara ka ọ na-arịọchitere anyị arịrịọ.—Ndị Hibru 7:25.

Ò nwere ihe o mere ma m na-ekpegara Chineke ekpere, na-ekpegakwara ndị sent ekpere?

 Chineke kwuru n’Iwu Iri ahụ o nyere ụmụ Izrel, sị: “Mụ Jehova Chineke gị bụ Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 20:5, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.) Olee otú Chineke si bụrụ Chineke “ekworo”? Otú Baịbụl ụfọdụ si sụgharịa ya bụ na Chineke “chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị ya ka anyị ga na-efe ofufe. Ekpere sokwa n’ofufe a ga na-enye naanị ya.—Aịzaya 48:11.

 Ọ bụrụ na anyị ekpegara onye ọ bụla ọzọ ekpere, ọ sọgodị ya ya bụrụ ndị sent ma ọ bụ ndị mmụọ ozi dị nsọ, anyị na-akpasu Chineke iwe. Mgbe Jọn onyeozi chọrọ ife otu mmụọ ozi ofufe, mmụọ ozi ahụ gwara ya ka ọ ghara ime otú ahụ. Ọ sịrị Jọn: “Emela ya! Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị ndị nwere ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs. Fee Chineke.”—Mkpughe 19:10.