Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịna-ekpe Ekpere? M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịna-ekpe Ekpere? M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee, Chineke ga-aza ekpere gị. Ma akụkọ a kọrọ na Baịbụl ma ihe ndị mere ndị mmadụ na-egosi na Chineke na-aza ekpere. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha. Ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.” (Abụ Ọma 145:19) Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke za ekpere gị, ị ga-ekpe ya otú ọ chọrọ ka i si kpee ya.

Ihe Chineke chọrọ ka ndị na-ekpegara ya ekpere mee

  •   Chineke chọrọ ka anyị na-ekpegara naanị ya ekpere. Ọ chọghị ka anyị na-ekpegara Jizọs, Meri, ndị nsọ, ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ihe oyiyi ekpere. Naanị Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.”​—Abụ Ọma 65:2.

  •   Na-ekpe ekpere kwekọrọ n’ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme bụ́ ndị dị na Baịbụl.​—1 Jọn 5:14.

  •   Na-ekpe ekpere n’aha Jizọs. Nke ahụ na-egosi na ị na-akwanyere Jizọs ùgwù. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”​—Jọn 14:6.

  •   Ejila obi abụọ ekpe ekpere. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Chineke nyekwuo gị okwukwe, rịọ ya ka o nye gị ya.​—Matiu 21:22; Luk 17:5.

  •   Dịrị obi umeala ma si n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị elu, ma ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi.”​—Abụ Ọma 138:6.

  •   Ike agwụla gị n’ikpe ekpere. Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu.”​—Luk 11:9.

Ihe ndị na-agaghị egbochi Chineke ịnụ ekpere gị

  •   Obodo i si ma ọ bụ agbụrụ gị. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”​—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

  •   Otú i si nọrọ mgbe ị na-ekpe ekpere. I nwere ike ịnọ ọdụ, hulata isi, gbuo ikpere n’ala, ma ọ bụ guzoro ọtọ mgbe ị na-ekpe ekpere.​—1 Ihe E Mere 17:16; Nehemaya 8:6; Daniel 6:10; Mak 11:25.

  •   Ikpepụta ekpere gị ekpepụta ma ọ bụ ikpe ya n’obi gị. Chineke na-azadị ekpere mmadụ kpere n’obi ya.​—Nehemaya 2:1-6.

  •   Na mkpa gị buru ibu ma ọ bụ na o bughị ibu. Chineke gwara anyị ka anyị ‘na-atụkwasị ya nchegbu anyị niile, n’ihi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.’​—1 Pita 5:7.