Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Nwoke Ibe Ya Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ịlụ Nwaanyị Ibe Ya?

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Nwoke Ibe Ya Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ịlụ Nwaanyị Ibe Ya?

Ihe Baịbụl kwuru

 Tupu ndị ọchịchị ekwuwe ihe ha chere n’okwu gbasara alụmdi na nwunye, onye kere anyị agwala anyị ihe anyị kwesịrị ime. N’akwụkwọ Jenesis 2:24, Chineke kwuru na nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha aghọọ otu anụ ahụ́. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na “nwunye” e kwuru okwu ya n’amaokwu Baịbụl a bụ “nwaanyị.” Na Matiu 19:4, Jizọs kwuru na ndị kwesịrị ịlụ ibe ha bụ “nwoke na nwaanyị.” Ihe a o kwuru kwadoro ihe ahụ Chineke kwuru n’akwụkwọ Jenesis.

 N’eziokwu, Chineke chọrọ ka ọ bụrụ nwoke na nwaanyị ga na-alụ ibe ha. Ha lụọ, ha ga-ebi ka di na nwunye ruo ebighị ebi. Chineke chọkwara ka di na nwunye na-eme ibe ha obi ụtọ, ka ha na-enwe mmekọahụ, nakwa ka ha mụta ụmụ.